Take a fresh look at your lifestyle.

Ọ bụ iwu onyeisiala isi na mpaghara Naịjirịa dị icheiche họpụta ndị isi ọrụ nchekwa?

0 309

Dịka onyeisiala Bola Ahmed Tinubu họpụtara ndị isi ọhụrụ maka ngalaba ọrụ nchekwa Naịjirịa dị icheiche, nrụrịtaụka na-aga n’ihu ugbua na soshal midia dịka ndị mmadụ ji ndị ọhụrụ a ahọpụtara na-atụnyere ndị nke Muhammadu Buhari họpụtara oge ọ bụ onyeisiala.

Ọtụtụ toro Tinubu maka isi na mpaghara Naịjirịa dị icheiche họrọ ndị mmadụ, ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwu na ihe dị mkpa abụghị mpaghara onye si kama ma onye ahụ ọ ga-arụkwa ọrụ nke ọma iji weta ezi nchekwa.

Osikhena Dirisu, onye ntaakụkọ radio a ma ama kwuru na obi dị ya ụtọ etu nhọpụta a Tinubu mere si gosipụta ịdịnotu Naịjirịa n’agbanyeghị ndịiche.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *