Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ị ga-esi jikwaa ahụ ọkụ

0 624

Ọ dị mkpa ime ihe ngwangwa ma onye agadị nwee ọbụladị ntakịrị ahụ ọkụ.

Ọ bụrụ na mmadụ nwee ahụ ọkụ, ọ dị mkpa ka e jikwaa ya ngwangwa, ma ọ bụghị ya, mmiri dị mmadụ n’ahụ nwereike ịgbatu.

Ọ bụrụ na ahụ ọkụ na-anọte aka, ọ na-esiwanye ike ịkwụsị ya, ọ kacha n’ahụ ụmụaka na ndị agadi.

  • Na-aṅụ mmiri nke ọma iji gbochie mmiri dị gị n’ahụ ịgbatu (dehydration)
  • Ọ bụrụ n’ahụọkụ ahụ ka njọ, were akwa metụ na mmiri dị ṅarịṅarị ma hichaa ahụ gị iji jikwaa ekpomọkụ ahụ. Ejila mmiri oyi maka na o nwereike ibute nkụja (shock).
  • Buru ụzọ hichaa aka gị na ụkwụ gị tupu i hichaa ahụ niile
  • ‘Paracetamol’ bụ ọgwụ maka ahụọkụ
  • Ọ bụrụ na ahụọkụ akwụsịghị n’ime abalị abụọ, gaa hụ dọkịta
  • Aṅụkwala ọgwụ e ji egbu nje bakteria maka na ị mabeghị ihe kpatara ahụọkụ ahụ, ọgwụ ‘antibiotics’ na-ebute ike ọgwụgwụ karịa

Ọ bụrụ nwata ka ahụọkụ na-eme:

  • Na-enye ya mmiri ọṅụṅụ
  • Ọ bụrụ na ọ na-ekwe iri nri, nye ya nri
  • Na-eleta ya ugboro ugboro dịka ọ na-arahụ ụra abalị
  • Nye ya ‘paracetamol’, tulee akwụkwọ dị n’ọgwụ ahụ nke ọma iji mara ma ọ bụ ụdị ụmụaka nwereike ịṅụ
  • Gaa ụlọọgwụ ngwangwa iji mata kpọmkwem ihe na-eme nwa gị

Ihe ndị ikwesịghị ime:

  • Eyipụchala ya akwa ya niile ma chee na ọ ga-eme ka ahụ ya jụlata oyi
  • Ejila ọtụtụ akwa kpuchie ya
  • Ya nọrọ n’ụlọ, akpọgala ya ụlọ akwụkwọ
  • Enyekwala nwata erubeghị afọ 16 ọgwụ ‘aspirin
  • Enyekọtala nwata ọgwụ paracetamol na ibuprofen
  • Enyekwala nwata erubeghị ọnwa abụọ ọgwụ ‘paracetamol’
  • Enyela nwata erubeghị ọnwa atọ, maọbụ nwata ibu ya erughị 5kg ọgwụ ibuprofen
  • Enyela nwata nwere ọnọdụ ‘asthma’ ọgwụ ibuprofen, ma ọ bụrụ na ọ bụghị dọkịta nyere ntuziaka

Ọ dị mkpa ịmata na ahụọkụ n’onwe ya abụghị ọrịa, kama ọ bụ ihe ngosi na mmadụ nwere ọrịa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *