Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Ebonyi Steeti Akwadola Nkesa Ndị Odeakwụkwọ Na-adịgide Adịgide

0 511

Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru akwadola ka e webata ndị odeakwụkwọ na-adịgide adịgide iri na abụọ na ministri ndị ọzọ.

Nkesa ọrụ a dị n’akwụkwọ ozi e wepụtara n’Abakiliki, isi obodo steeti na Tọzdee site n’ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasa ozi nke Gọvanọ, Dr Monday Uzor.

Ọ kọwara na “atụmatụ ahụ bụ akụkụ nke usoro e mere iji megharịa ngalaba ọrụ obodo na nke ọha iji mee ka ha na-arụ ọrụ nke ọma.”

Ndị odeakwụkwọ na-adịgide adịgide metụtara gụnyere Mr Monday Nkwuda (Ọrụ na Ụgbọ njem), Oriakụ Joy Mbam (Lands and Survey) na Maazị Chukwuma Ojiogu (Power).

Ndị ọzọ bụ Oriakụ Uzoma Betty (Public Procurement Council), Maazị Albert Aloh (Justice) na Maazị Ogbonnaya Ota (Internal Security).

Ndị ọzọ bụ Oriakụ Ogechi Ugwuocha (Lagos Liaison Office), Oriakụ Felicia Arusi (Agriculture), Oriakụ Mfon Williams (Finance), Maazị Kizito Nwovu (Abuja Liaison Office) na Oriakụ Henrietta Oruh (Infrastructure).

Nkesa ọrụ a na-ebido ịdị ire ozugbo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *