Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe Kasị Elu Wepụrụ Ebubo Megide Tinubu Na Shettima .

Salihu Ali, Abuja derek ya na bekee.

0 187

Ụlọikpe Kasị Elu nke Naijiria akagbuola mkpegharị nke Peoples Democratic Party (PDP), na-achọ ka a kagbuo onye isi ala Ahmed Tinubu na osote ya bụ Kashim Shettima na ntuli aka onyeisiala na February 25.

 

Ụlọikpe ahụ kwadoro mkpebi ụlọikpe mkpegharị ikpe na ikpe mmadụ atọ n’aka Justice James Abundaga nọ n’isi ya, bụ ndị ji otu olu kwuo na PDP ekwesighi ikwu otu a.

 

N’ịkpe ikpe ya n’ụbọchị Fraịde, ụlọikpe ukwu ahụ kwuru na PDP na-ekpe ekpere ka achụpụ Tinubu na Shettima n’ihi nhọpụta nke Shettima mere ugboro abụọ.

 

Jọstis Adamu Jauro bụ onye nyere mkpebi ikpe ahụ dara  PDP nde naira abụọ,  maka ikwu otu a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *