Take a fresh look at your lifestyle.

Aquaculture Maka: Nchekwa Nri Na Naijiria—Mịnịsta Na-Ahụ Maka Ọrụ Ugbo kwuru.

Chigo dere ya na bekee.

0 526

Ụlọ ọrụ Federal Ministry of Agriculture na Rural Development (FMARD) kwuru na gburugburu mmiri dị oke mkpa na ụzọ maka nchekwa nri na Naijiria.

 

Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Dọkịnta Mahmood Abubakar bụ onye nọchitere anya ya bụ Oriakụ Fausat Lawal bụ onye isi ngalaba na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche nke FMARD mere ka a mara nke a ụnyahụ na mwepụta akwụkwọ iwu ọhụrụ ebe o kwuru na aquaculture bụ ngalaba na-eto ngwa ngwa na enyerela aka ịkwalite mmepụta azụ.

 

Okwu ya: “N’agbanyeghị na anyị na-akwado maka nchekwa nri, anyị ga-akwadokwa maka nri na-edozi ahụ. Ọ dị ezigbo mkpa na anyị nwere nri na-edozi ahụ.

 

“Site na mmalite, anyị niile maara uru nri dị n’ime mmiri bara,ọkachasị azụ na nri anyị. A dụrụ anyị ọdụ ka anyị riwe ọtụtụ azụ dị ka anyị nwere ike. Na dị ka m maara, ọtụtụ ụmụ nwanyị na-azụ ahịa azụ.”

Ọ gara n’ihu kọwapụta na ụlọ ọrụ gọọmentị etiti na-ahụ maka ọrụ ugbo na-agba mbọ na-aga n’ihu n’ime ka ihe ndị a na-emepụta n’ugbo dịịrị ndị Naijiria, ka ha wee kwalite nri oriri na-edozi ahụ ma mepụta ohere ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *