UNICEF ji ihe nkuzi kwado ụlọ akwụkwọ na Steeti Adamawa
Otu Mba uwa n’ahụ maka ụmụaka (UNICEF) akwadola ụlọ akwụkwọ di iri naSteeti Adamawa na ihe eji akuzi nkuzi iji kwalite nkuzi na mmụta n’ụlọ akwụkwọ ọha di na steeti ahụ.
Onye isi ụlọ ọrụ ahụ na Bauchi, Mr Abdulrahman Ibrahim, ka ọ na-ekesa ihe nkuzi na Yola, kwuru na e nyere ihe ndi a iji kwalite agụmụ akwukwo.
Ọ gwakwara ụlọ akwụkwọ ndị na-erite uru a ka ha jiri ihe ndị a na-emeputa ihe iji belata oke nkwụsị ejeghi akwụkwọ na steeti ahụ.
Ka ọ dị ugbu a, Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mmepe ego mmadụ, Wulbina Jackson, kelere onyinye UNICEF na ndị mmekọ ndị ọzọ iji kwalite ohere agụmakwụkwọ dị mma na steeti ahụ. N’okwu ya, onye isi oche nke Adamawa State Universal Basic Education (ADSUBEB), Dr Salihi Atequ, kwuru na a ga-eji ngwa ahụ mee ihe n’ụzọ ziri ezi.
Leave a Reply