Take a fresh look at your lifestyle.

Anyị ka na-eche ụgbọala bọọsụ ga-ebupụ anyị, enweghi onye anyị hụrụla – Nwa akwụkwọ Naijirịa na Sudan

0 575

Otu nwata akwụkwọ Naijirịa bi na Sudanma na-agụ akwụkwọ na mahadum Nahda College onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndi ntaakuko n’ehihe Tuzde a na ha natara ozi n’aka gọọmentị Naijirịa ka ha gbakọta n’otu ebe bụ ebe a sị ụgbọala bọọsụ ga-abịa buru ha pụọ mana o nwebeghị onye ha hụrụ.

N’okwu ya ọ sị:

“A sị anyị pụta kemgbe elekere isii nke isi ụtụtụ n’akụkụ ọtụ ebe bụcha mahadum dị iche iche na Sudan. Ihe na-akụ ugbua bụ elekere mbụ nke ehihe mana enwebeghi onye anyị hụrụ anya ịbịa bupu anyị.”

O kwukwara na ọnọdụ ihe amalitela isiri ndị mmadụ gụnyere ụmụafọ Naijirịa nọ ebe ahụ ike nke gụnyere enweghị nri, enweghi mmiri nakwa enweghi ịnatenetị ha ga-eji agwa ndị ezịnaụlọ ha okwu.

Nwaakwụkwọ a kwuru na akụkụ ebe nke ọ nọ na-eche ka a bịa buru ha bụ n’ime mahadum African University nọ n’isiobodo Sudan bụ Khartoum.

Ọ gara n’ihu kọwa na ebe ndị ọzọ a sị ụmụafọ Naijirịa gbakọta bụkwa n’ime mahadum Elrazi University nakwa Omdurman University nke nọ n’obodo Omdurman.

O kwukwara na gọọmentị Naijirịa agbaala mbọ na-ezitere ha ozi ugboro ugboro kemgbe ọghaghara malite ịda ebe ahụ.

Ọtụtụ ụmụafọ Naijirịa bi na Sudan ma na-agụ akwụkwọ ebe ahụ ọkachasị ndị si mpaghara ugwu Naijịrịa.                                                              A na-eche na ụmụakwụkwọ ndị Naịjriịa nọ na Sudan ugbua ruru 5,500.

Na Tuzde a, ụlọọrụ na-ahụ maka ọdịnma ndị Naijirịa nọ na mba ndị ọzọ nakwa enyemaka ndị nọ n’ihe ọdachị bipụtara akwụkwọ nke e tinyere akara ekwentị ụmụafọ Naijirịa na Sudan nwereike ịkpọ ma ha nwee nsogbu ọbụla

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *