Take a fresh look at your lifestyle.

 Ọmụgwọ

Chigo dere ya na bekee.

0 537

 Ọmụgwọ

Ọmụgwọ bụ ọmenaala Igbo bidoro kemgbe gboo nke ka na-eme ruo ugbua

Ile ọmụgwọ n’omenala Igbo bụ oge nne na-abịa ileta nwa ya nwaanyị na nwa ọ mụrụ (nke bụ nwa nwa ya).

Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị enweghịzị nne (ọ bụrụ na nne mụrụ ya anwụọla), nwunye nna ya maọbụ nne di ya ga-abị nọrọ n’ụlọ ya lee ya ọmụgwọ.

Ihe mere o ji bụrụ nwaanyị na-ele ọmụgwọ kama nwoke, bụ maka na a na-ewe ya na ọ bụ nwaanyị kacha mara ihe gbasara ya maka na ọ gabigala ọnọdụ ahụ n’onwe ya.

Oge ọmụgwọ bụ oge nne na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe niile ọ ma maka ilekọta nwa a mụrụ ọhụrụ.

Ụfọdụ oge, ọ na-abụ nne mụrụ nwa laa, nne di ya abịa bido lewe ya ọmụgwọ nke ya.

Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-eji ohere ọmụgwọ zuru ike ma nne ya na-elekọta nwa ya.

Uru ọmụgwọ bara

Ọmụgwọ bụ oge nne, nwa ya na nwa nwa ọhụrụ ya na-eji enwe ezigbo mmekọrịta nke bekee kpọrọ ‘bonding’. Maka nke a ka ọtụtụ ndị nne na-eji aga ebe ọbụla nwa ha nọ mụọ nwa, ma n’ụlọ maọbụ na mba ofesi, ịga nọkọọ ihe ruru ọnwa atọ maọbụ karịa.

Ọ ga-akuzikiri nwa ya nwaanyị ihe ubeakwa nwa ya pụtara, maọbụ akwa agụrụ maọbụ akwa mmekpa ahụ.

‘Ụmụnwaanyị anyị kajara akaja’ – Charly Boy

Nri ekwesịrị iri n’ọmụgwọ

Nwaanyị a na-ele ọmụgwọ nwere nri ndị ọ na-eri. Ụfọdụ bụ iji asụchapụ ọbara kpụkọrọ ya n’afọ oge nwa nọ ya n’ime. Nri ndị a bụ ma mkpọrọgwụ ma ngwanri dị icheiche.

  • Ofe mmiri ụda
  • Ji mmiri ọkụ
  • Ofe nsala
  • Mmiri ọgwụ etere ete
  • Tii dị ọkụ na akamụ
  • Nri asụrụ asụ
  • Nzu
  • Azụ ọkpọọ na okporoko
  • Anụ ọkụkọ
  • Ụda
  • Ehuru na ehu
  • Ụzịza
  • Ụtazị
  • Nri ọbụla ga-enwe ezigbote ose

 

Nri nwaanyị ekwesịghị iri n’ọmụgwọ

  • Ihe juru oke oyi
  • Egwusi, ọgbọnọ na ofe ọbụla e ji mmanụ e si
  • Ahuekere
  • Nri ọbụla nwere abụba (nwaanyị anaghị eri ya maka na a na-ewe ya na abụba ga-akpụkọ ya n’afọ maọbụ n’ahụ)

Ngwụcha ọmụgwọ

Ọmụgwọ gwụ, nne bịara ọmụgwọ ga-enweta ihe buru ibu.

Ndị ọ bịara ileta ga-azụtara ya ihe onyinye dị icheiche dịka ego, akwa ọmụma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe nri dị icheiche, wee dịrị gawazie.

A ga-azụtara ya akpa nnu na akpa ncha nke ọ ga-eke ndị agbataobi ya ma ọ laruo ebe o bi.

BBC

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *