Take a fresh look at your lifestyle.

Ebubo Lai Mohammed na-ebo m bụ ebubo ụgha – Peter Obi

0 377

Peter Obi, onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’otu ‘Labour Party’ ekwuola na gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya ebubo ụgha ma na-ekwu na ya na-akpa nkata ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.

Obi kwuru nke a n’ịzaghachi ebubo a Lai Mohammed, bụ Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa, boro ya dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na mba Amerịka Obi kwuru na “ọ bụ ihe mwute mbọ dị icheiche nke a na-agba iji metọọ aha ya ma gosipụta ya dịka ihe ọ bụghị”.

“Mịnịstra Lai Mohammed ibo m ebubo na m na-akpata ọgbaaghara bụ okwu ụgha nakwa ihe abụghị eziokw.”

“Onwebeghị mgbe m ji nwee mkparịtaụka maọbụ nye onye ọbụla ndụmọdụ ilelị obodo Naịjirịa anya. Ekwubeghị m okwu ọbụla maọbụ kwadoo atụmatụ ọbụla megide Naịjirịa.

“Ọ bụ ndị na-eme ihe dị otu a na-ejikwa ikike ọkwa ha gbalitere agbalite nakwa ndị ọrụ ha na-ebo m ebubo ụgha ndị a.

“O doro anya na m na-agagharị na-ekwu okwu ga-akwalite udo, onweghịkwa mgbe m chụrụ nta vootu n’ịgbado ụkwụ n’agbụrụ maọbụ n’okpukperechi. Atụkwasịrị m obi n’ụzọ ziri ezi, ugbua, esikwa m n’ụzọ ụlọikpe na-achọ mmezi.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *