ADS bụ ọnọdụ dị icheiche nke ihe na-akpata ya bụ mgbanwe dị icheiche n’ụbụrụ mmadụ.
O nwerike imetụta etu mmadụ si ahụta ihe maọbụ anabata maọbụ azaghachi ozi dị icheiche.
ADS na-enwe ogogo nke mbụ, nke abụọ, na nke atọ; ndị nwere ADS ogogo nke atọ na-achọ nkwado pụrụ iche oge niile.
Ụbọchị nke abụọ n’ọnwa Eprel afọ ọbụla bụ ụbọchị nke otu ‘United Nations’ wepụtara dịka ‘World Autism Awareness Day’.
A malitere emume a n’afọ 2007 iji na-agbasa ozi maka ọnọdụ ‘autism’ nakwa ịgbasa ozi maka ụzọ dị icheiche a ga-esi wulite ọnọdụ ndụ ndị nwere autism.
Leave a Reply