IRU MGBEDE.
Na mgbe gboo ahụ, nwaanyị agaghị alụ di ma o rughi mgbede.
Ọtụtụ obodo na-emere ya ụmụagbọghọ ruru afọ iri abụọ maọbụ karịa.
A na-akpọ ya aha dị iche iche n’obodo dị iche iche dịka: iru mgbede, ịda mgbede maọbụ ịba mkpuke.
iru mgbede bụ emume nne na nna na-emere ụmụ ha ndị nwaanyị tozurula ịlụ di.”
“Ọ bụ oge e ji akpọba ha n’ụlọ, leta ha anya nke ọma”.
Mgbe ahụ, ha agaghị arụ ọrụ ọbụla.
O nweghi ihe mgbakasị ahụ aga ekwe ka ọ metụta ha.
ọ bụ oge nwaanyị hụrụ nsọ ya izizi bụ mgbe o ji aga iru mgbede.
- Naanị ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị nne na-aba ebe ahụ. Ha na-aga akụziri ndị na-eru mgbede etu e si ebi dịka nwaanyị nakwa nwunye n’ezinaụlọ”.
Ụmụnwaanyị na-aba n’ụlọ megbede dịka ụmụaka ma pụta dịka agbọghọ tozuru etozu.
Leave a Reply