Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii anwụchịela ndị omekome ise na Anambra

0 375

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’akụkụ Ihiala nke Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga ekwuola na ha wụchiri ndị omekome ise ma napụ aha egbe ‘Pump action’ anọ.

Nke a na-apụta dịka ntuliaka na-aga n’ihu na steeti ahụ ebe gọọmentị Naịjirịa machiri ngagharị ndị mmadụ n’akụkụ Naịjirịa niile malite n’elekere iri na abụọ nke isi ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede taa.

Ihiala so n’akụkụ steeti ahụ ebe akụkọ mwakpo na-apụtakarị dịka n’oge ntuliaka enweghi ezi nchekwa ebe ahụ mere emeghi ntuliaka ebe ahụ n’ụbọchị mbụ.

Inec mechara hazigharịa ntuliaka ebe ahụ.

Ndị uweojii Anambra zipụtara ozi na ha agaghị ekwe onye maọbụ otu ọbụla majaa ndị pụtara ịtụ vootu dịka ha kwuru ha kwụụ chim ichekwa ndị mmadụ.

Ikenga kwuru na ha na-eme nnyocha n’isi mmadụ ise a awụchiri ugbua.

Leave A Reply

Your email address will not be published.