Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti steeti Anambra ga-ewebata ọgwụ mgbochi ọrịa Rotavirus n’ime ọgwụ mgbochi.

Chinwe Onuigbo, Awka dere ya na bekee.

0 543

Gọọmenti steeti  Anambra  ga-ewebata ọgwụ mgbochi ọrịa Rotavirus n’ime ọgwụ mgbochi.

Gọọmenti Anambra  na mmekorita ya na World Health Organisation (WHO) na United Nations Children Fund (UNICEF) akwadola iwebata ọgwụ mgbochi Rotavirus n’ime ọgwụ mgbochi a na-eme kwa ụbọchị na Tuzdee Nọvemba 29, 2022.

Odeakwụkwọ Executive, Anambra State Primary Healthcare Development Agency, Dọkịnta Chioma Ezenyimulu kwuputara nke a n’Awka n’ime otu ụbọchị nzụkọ njikọ aka ndị otu maka iwebata ọgwụ mgbochi Rotavirus.

Dọkịnta Ezenyimulu kwuru na ọrịa afọ ọsịsa nke Rotavirus na-ebidokarị na ụmụ ọhụrụ na ụmụaka dị ọnwa atọ na iri atọ na ise na dịka WHO siri kwuo, ọrịa afọ ọsịsa bụ nke abụọ na-ebute ọnwụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *