Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ nụ maka ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị a na-eche na ọ bụ naanị mgbe ihe nwoke jiri bụrụ nwoke metụtara nke nwaanyị.
Mana ndị ọrụ ahụike ekwuola ugboro ugboro na mmadụ nwereike ibute ọtụtụ ọrịa site n’ịmị ọnụ maọbụ iji ọnụ tinye n’akụkụ ahụ nwoke maọbụ nwaanyị dịịrị onye ahụ.
Ọrịa na-ebutekarị site n’ụzọ ọnụ a bụ ọrịa ‘gonorrhea’ na ‘syphilis’.
Otu onye dọkịnta aha ya bụ Udodi Okoli kọwara ndi ntaakụkọ ihe dị mkpa banyere etu e si egbochi ọrịa ndị a.
Gonorrhoea: Ọrịa a so n’ọrịa ndị mmadụ nwereike ibute ma nwoke na nwaanyị maọbụ nwoke na nwoke nwee mmekọ na-ejighị okpu nna bụ enyị mana mmekọ a gụnyekwara ịmị ọnụ maọbụ itinye ọnụ n’akụkụ ahụ ma-enyeghị okpu nna bụ enyị.
Nnyocha ụlọọrụ NOIPolls mere n’afo 2020 gosiri na naanị pasentị iri atọ na anọ ndị tozuru oke mmekọ na-eji okpu nna bụ enyị n’oge mmekọ ha.
Okoli kọwara na ọrịa a na-arị elu aghara aghara na Naịjirịa ma kwuo “Ndị ntorobịa na-eleghara ihe ga-echekwa ha anyị”
O kọwakwara na njiri mmara ọrịa a n’ahụ mmadụ gụnyere isi n’amụ maọbụ otu na-anyụpụta mmiri na-acha edo edo maọbụ ka akwụkwọ nrị. Ihe ndị ọzọ gụnyekwara oke mgbu ma mmadụ na-anyụ mmarị nakwa nwaanyị ịgba ọbara n’oge ọ nọghị na nsọ ya, ọkọ n’ime ike mmadụ.
Mana o kwukwara “Njiri mmara ọrịa a naghị egosi onwe ya n’utu nwaanyị maọbụ n’ike onye bu ya”.
Dịka Okoli si kwuo, mmadụ hapụ ọrịa a n’ahụ ya ma ghara ịlebara ya anya ruo oge dị anya, o nwereike ibutere onye ahụ ọnọdụ amụghị nwa, nakwa ọrịa ọzọ a na-akpọ ‘pelvic inflammatory disease’.
Dọkịnta Oderinde Wunmi kọwara na ụzọ mmadụ nwereike isi chekwawa onwe ya n’aka ọrịa a bụ:
- Ịgbalahụ mmekọ nwoke na nwaanyị maọbụ nwoke na nwoke kpam kpam
- Ịji okpu nna bụ enyị n’oge ọbụla mmadụ na-enwe mmekọ (nke gụnyere mmekọ eji ọnụ eme)
- Mmadụ ịghara ime mmekọrịta aghara aghara ma nwee naanị otu onye ọ na-edịna.
Nwoke kwesịrị iyi okpu nna bụ enyị n’oge mmekọ ma ọ bụrụ na onye nke ya ga-etinye ọnụ n’utu ya.
Syphilis: Ọrịa a sokwa na ọrịa mmadu nwereike bute site na mmekọ eji ọnụ eme. Oderinde kọwara na njirimara ọrịa a gụnyere ọnya ịwụkasị mmadụ n’akụkụ ọnụ maọbụ n’akụkụ utu nwoke maọbụ nwaanyị, ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa na ahụ mgbu nakwa ahụ mmkpomọkụ.
Oderinde kwusiriike “Ndị mmadụ kwesịrị ima na a na-ebute ọrịa a aghara aghara site n’itinye ọnụ n’akụkụ utu nwoke maọbụ utu nwaanyị”
“Ụfọdụ chere na ma ọ bụrụ na ihe nwoke jiri bụrụ nwoke abanyeghị ahụ ha na agbalahụla ọrịa a mana nke a bụghị eziokwu”.
Okoli tinyekwara ọnụ n’okwu a gbaa ama ihe Oderinde kwuru. Ọ gara n’ihu kọwa na mmadụ ghara ịlebara ọrịa anya n’ahụ ya ruo oge dị anya, onye ahụ nwereike ifeba n’ụbụrụisi onye ahụ ma butekwa ọnwụ.
Dịka ọrịa Gonorrhoea, ụzọ mmadụ nwereike isi chekwawa onwe ya n’aka ọrịa a gụnyere:
- Ịgbalahụ mmekọ nwoke na nwaanyị maọbụ nwoke na nwoke kpam kpam
- Ịji okpu nna bụ enyị n’oge ọbụla mmadụ na-enwe mmekọ (nke gụnyere mmekọ eji ọnụ eme)
- Mmadụ ịghara ime mmekọrịta aghara aghara ma nwee naanị otu onye ọ na-edịna.
HPV: Ọrịa a nke aha uju ya na Bekee bụ ‘human papillomavirus’ sokwa n’ọrịa ndị mmadụ nwereike ibute site n’iji ọnụ mee mmekọ nwoke na nwaanyị.
Ọrịa a anaghị ebutekarị njirimara n’agba n’ọha ọ bụla – mana o nwereike ịkpata ihe dịka otutu (warts) n’akụkụ utu nwoke maọbụ utu nwaanyị, n’ime ọnụ maọbụ n’aka nakwa ụkwụ.
Nke a mere na ọtụtụ ndị mmadụ agaghị ama na ha bu ọrịa a. Otu ihe dị mkpa bụ na ọrịa a, n’ọtụtụ oge n’eji aka ya ala n’ahụ mmadụ mana ụdịrị ọrịa a nke dị njọ nwereike ibutere mmadụ ọrịa akpụ (cancer).
Otu ahụike ụwa bụ WHO ekwuola na pasentị 90 ụmụnwaanyị nọ n’ọnọdụ ọrịa akpụ nke utu (Cervical cancer) na mba ndị na-enweghị ka ọ hara ha butere ya site n’ọrịa HPV.
A na-akacha ebute ọrịa a na-efe efe nke ukwuu site na mmekọ ejighi okpu nna bụ enyi mee.
Okoli kwuru na nwoke ọbụla marala nwaanyị maọbụ nwaanyị ọbụla marala nwoke enwerela ike ibu ọrịa a.
O kwukwara na e nwere ọgwụ mgbochi ọrịa a mana a na-enyekarị naanị ya ụmụ ntorobia na-agafebeghị afọ iri na asatọ.
E nwere ụdịrị okpunna bụ enyị dịịrị ụmụnwoke nakwa ụmụnwaanyị mmadụ kwesịrị iyi n’oge mmekọ.
Herpes: Herpes so n’ọrịa a na-ebute site na mmekọ nke gụnyere nsusu ọnụ nakwa itinye ọnụ n’akụkụ utu nwoke na nwaanyị n’oge mmekọ.
E nwere ụdịrị Herpes dị iche iche nke gunyere “Herpes Simplex virus type 1 (HSV-1) na “Herpes Simplex virus type 2 (HSV-2).
Oderinde kwuru: “Anaghị agwọ ọrịa herpes agwọ mana enwere ọgwụ ndị bu ya ga-esi nyere onwe ha aka.”
I jị maa atụ , HSV-1 na-emekarị n’ọnụ ebe HSV-2 na-eme n’ike, ọtụ maọbụ amụ.
O kwukwara na “mmadụ were ọnụ ya metụ onye bu HSV-2, HSV-2 nwereike ime ya n’ọnụ”.
“Eziokwu bụ na ọbụghị iwu na mmadụ ga-edina mmadụ tupu o bute ọrịa herpes”.
WHO kọwara na ọrịa a nwereike ịghara igosi onwe ya n’ahụ onye bu ya mana njirimara ya gụnyere: Ọnya n’akụkụ ọnụ maọbụ n’akụkụ utu.
Mana Okoli kwuru, “Ọ bụghị kwa iwu na mmadụ ga-ahụ ọnya tupu ị mara na ị bu ọrịa Herpes n’ihi na onwere ike izo n’ahụ mmadụ”.
“ Ime nnyocha ime ahụ kwa mgbe kwa mgbe maka ọrịa enwereike isi n’aramara bute dị ezigbo mkpa”
Ọ gara n’ihu kwuo: “nchọpụta ọrịa ndị a n’oge n’ahụ mmadụ dị mkpa maka ịmalịte ọgwụgwụ nke ga-azọ ndụ mmadụ”.
Na nchịkọta, o kwuru na ọrịa ndị ọzọ mmadụ nwereike isi na mmekọ eji ọnụ eme bute gụnyere:
Chlamydia, Hepatitis A, B na C, HIV , Monkey Pox wdgz.
Oderinde kwuru na “Umụnwoke na-edịna ụmụnwoke na-adanyekarị n’ọnwụnwa ịghara iji okpu nnabụenyị mee mmekọ maka ha anaghị atụ ụjụ ituru ime.”
“Ọzọ kwa bụ na mfesa ịṅụ ọgwụike n’etiti ndị ntorobịa arịala elu nke mere ka ha ghara itinye uchu n’ịchekwa onwe ha etu ha kwesiri n’oge mmekọ”.
Leave a Reply