Take a fresh look at your lifestyle.

Ifeanyi Alumona bụ onyeisi ojii mbụ ritere ntụrụugo AFS

0 377

Ifeanyị Alumona bụ onyeisiojii mbụ ritere ntụrụugo nke AFS Award for Young Global Citizens.

Alumona bụ onye Afrika mbụ ritere nke a kamgbe afọ 1914.

Alụmona onye Enugwu steeti nke dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa kwuru na ọ bụ nkata ya na onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Barak Obama kpara gbara ya ume o jiri jisie ike n’ọlụ.

Ọ na-agba mbọ ịkwụsị mkpagbu na mmegide a na-emegide ụmụ nwaanyị ọkachasị na Naijirịa.

Ọ bụ site na ụlọọrụ ‘Boys Champion’ nke o bidoro n’afọ 2018 ka o ji agbasa ozi a.

Ya bụ ụlọọrụ na-akụzịrị ụmụokorobịa mkpa ọ dị ịchekwa ụmụnwaanyị.

Boys Champion na-ekuzikwara ha etu ha kwesịrị isi sopụrụ ụmụnwaanyị.

Leave A Reply

Your email address will not be published.