Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe EFCC boro Cubuna Prime Minister

0 429

A ma Lucky Uchechukwu Ndukwe dịka Cubana Prime Minister bụ onye ọrụ ebe oringo

Akụkọ ọhụrụ apụtala n’isi nwaamadị Lucky Uchechukwu Ndukwe, onye e ji Cubana Prime Minister mara, bụ otu n’ime ndị nlekọta ụlọọrụ Cubana Group.

Nwa amadị a nọ n’aka ngalaba ‘Economics and Financial Crime Commission’ (EFCC), bụ ụlọọrụ na-egbochi mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa.

Ndị EFCC boro Ndukwe na otu onye ọzọ aha ya bụ Precious Omonkhoa Ofure ebubo ibuba ego ruru  $164, 000.00 n’ụzọ ezịghị ezi.

A kpụpụrụ ha abụọ ụlọikpe dị n’Ikeja Legọs n’ụbọchị Wenezde, Ọgọst 24, 2022.

Oge ya bụ ikpe malitere, Ofure kwuru na o mere ya bụ ihe, mana Ndukwe kwuru na aka ya dị ọcha.

Ọkaikpe Fadipe nyere iwu ka a tụọ Ofure mkpọrọ afọ atọ maọbụ daa ya nha ịkwụ nde naịra abụọ nakwa ntaramahụhụ ịrụ ọrụ ọha n’efu ruo awa otu narị.

Ikpe nke gbasara ‘Cubana Prime Minister’ ka na-aga n’ihu ugbua.

Nnwụchi Ndukwe mere ka ndị mmadụ cheta ndị ọzọ metụtara Cubana Group nakwa onyeisi ya bụ Obi Cubana, bụ ndị ọrụ nchekwa nwụchịrịla, kpọrọla oku maọbụ kpụrụla ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka.

Leave A Reply

Your email address will not be published.