Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ụfọdụ aha ndị Igbo na-aza oge gboo

0 479

Okoroafọ, Okereke, Okoronkwọ na Okoorie bụ aha ụmụ nwoke

Akuagwu – Akụ na anaghị agwụ agwụ

Ahamefule – Nke a pụtara na agaghị echefu onye ahụ maọbụ na ama ya agaghị echi.

Anurunkem – Aha a na-ajụ ma enwere onye mara ihe ọ gabigara

Akankem – Aha dịka ajụjụ, Ọ bụ maka ọnọdụ m ka ị na-ekwu?

Afọọma – Ya na Ihuoma bụ otu ihe

Agwajimma – Agwa bụ mma mmadụ

Ahunanyaekwe – Ihe anya hụrụ ka mma iji gbaa ama

Chukwueke – Nke apụtara na ọ bụ Chukwu na-eke mmadụ

Chukwuegboogu – Aha a pụtara na ọ bụ Chukwu na-eweta udo

Chianuorumogu – Nke a bụ aha na-arịọ ka Chi onye ahụ lụọrọ ya ọgụ.

Chiagbanarinam – Nke a na-ekwu ka chị onye ahụ nonyere ya oge niile

Enyidiya – Nke abụ aha ụmụ nwaanyị na-egosi etu ya na dị ya si nwee ihunanya.

Ekemma – Nwata nwaanyị a mụrụ n’ụbọchị Eke.

na-ewetere ya,

Ihebuzoaju – Onye a na-ebu ụzọ achọta maọbụ ajụ ihe

Iheukwumere – Nke apụtara na oke mmadụ lọrọ onye ahụ uwa maọbụ na onye ahụ ga-abụ oke mmadụ

Ikweagwụ – Aha a pụtara na onye ahụ ga-enwe ike

Ihejiaba – Ihe mejipụtara akụ na ụba mmadụ

Nwaazụnahia – Aha pụtara na nwa dị oke mkpa ma na anaghị azụta nwa azụta

Nnaụgbọmma – Nna maọbụ onye na-eweta ihe ọma

Nnọchirionye – Aha pụtara na onye apụtara ụwa ị chọrọ nke ya na-enweghị onye ya na ya na-azọ ihe ọbụla.

Nwaogazirlila – Nwa ọ ga-agara nke ọma

Urubedi bụ aha ndị Igbo ji akwanyere alụmdịnanwunye Ugwu

Nwammuo –

Mgbaeke – Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị eke

Mkpachukwugboro – Nke a bụ aha na-egosi na onye ahụ bụ ngozi Chukwu jiri gboo mkpa.

Mgbaafọ – Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị afọ

Mgbanwkọ – Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị nkwọ

Mgbaorie – Nke a bụ aha nwaanyị a mụrụ ụbọchị eke

Ọnụhiaraodo – Aha pụtara na ọ bụ ihe mmadụ kwuru mere na onye ọzọ emeghị ihe ọma ọ chọrọ ịmere ya

Ọbụmneke – Nke a gosiri na mmadụ nabatara onwe ya

Oriemma – Nke abụ aha nwaanyị amụrụ ụbọchị orie.

Ọnụnekwu – Nke apụtara na ọ bụ ọnụ kwuru, maọbụ na ọ bụ ọnụ na-ebute okwu.

Ọnụzuruike – Aha pụtara ka mmadụ cgee uche tupu o kwuo okwu.

Ohajiriụka – Nke apụtara na ọ bụ ọha na-edozi esemokwu

Ọgọnna – Nke a pụtara na nna nwata na-ahụ ya dịka onyinye ọma

Ogoesookwu – Aha na-ekwu na ọgọ anaghị ebute esemokwu

Ogomegbunam – Obi ebere m agaghị egbu m

Onukwufo – Nke apụtara na ọ bụ ọnụ kwuru, maọbụ na ọ bụ ọnụ na-ebute okwu.

Uwaagaotuihu

Urubedi – Nke abụ aha ndị Igbo ji egosi na-alụdịnanwunye bara oke uru

Ụwaanụakwa – Ụwa anaghị anụ akwa mmadụ oge ụfọdụ

Ụwaadịghịkaechere – Aha na-ekwu na ọbụghị ihe mmadụ na-atụanya ka ụwa

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *