Onyeisiala Buhari anabatala Mahadum Jos ka ọ bụrụ ebe a na-ahụ maka ọrịa kansa.
Timothy Choji, Abuja dere ya na bekee.
Onyeisiala Buhari anabatala Mahadum Jos ka ọ bụrụ ebe a na-ahụ maka ọrịa kansa.
Onyeisiala Muhammadu Buhari akwadola Mahadum Jos dị na North-Central Nigeria ka ọ bụrụ ebe a na-ahụ maka ọrịa kansa.
Gọvanọ SteetiPlateau bụ Simon Lalong nyere akụkọ obi ụtọ n’ụbọchị Wednesde ka ọ na-aza ajụjụ ndị nta akụkọ sitere n’ụlọomeiwu steeti ka ya na onyeisiala Buhari zukọrọ na nzuzo.
O kwuru na ndị steeti ahụ ga-anọgide na-ekele Onye isi ala Muhammadu Buhari maka ngosi ọchịchị onye kwuo uche ya na steeti ahụ.
Dị ka ya si kwuo, “Nleta m na-agakwuru Onyeisiala bụ ka m bịa gosi ya obi ụtọ n’ihi ihe o meere Plateau steeti n’ọnwa ole na ole gara aga. Naanị otu izu ma ọ bụ abụọ gara aga, anyị nwetara nkwenye ime Mahadum Jos ka ọ bụrụ ebe a na-ahụ maka ọrịa kansa. Ahụrụ m ihe karịrị ijeri naira atọ akwadoro maka ụlọ ọrụ ahụ dị ka ebe pụrụ iche maka ọrịa kansa, yabụ na ọ bụghị obere mmezu.