Take a fresh look at your lifestyle.

Abuja: Kabinet kwadoro ijeri naira 2.6 maka ụgbọ ala eji arụ ọrụ, nchekwa.

TIMOTY CHOJI dere ya na bekee.

0 597

Federal Executive Council akwadola ijeri naira 2.6 maka ịzụrụ ụgbọ ala bara uru na akụrụngwa maka ụlọ ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ na Federal Capital Territory (FCT), Abuja.

Mịnịsta na-ahụ maka FCT, Mohammed Bello kwupụtara nke a mgbe ọ na-akọwara ndị nta akụkọ na-ahụ maka ụlọ ọrụ steeti maka mkpebi ha mere na nzukọ ndị isi nke Wednesde nke Onye isi ala Muhammadu Buhari duziri.

“Taa ewepụtara m akwụkwọ ndetu maka ịzụrụ ụgbọ ala, ngwa nchekwa na ngwa iji kwado ụlọ ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ n’ime Federal Capital Territory na ihe ndị a bụ ụgbọ ala 60, gụnyere akụrụngwa nkwukọrịta a ga-etinye n’ime ụgbọ ala, a ga-ebunye na ọnụ ahịa nke N1, 835, 108, 613,.95 n’ihe na-agaghi agafe  ọnwa abụọ.”

 

Ọzọkwa, o kpughere na ya nwetakwara nkwado maka ịzụrụ ngwa ọrụ ndị ọzọ na-arụ ọrụ maka ụlọ ọrụ nchekwa na-ahụ maka nchekwa FCT.

Leave A Reply

Your email address will not be published.