Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị Naịjirịa ezigarala ezinaụlo Chima Echefu ozi itiakan’obi

0 606

Gọọmentị Naịjiria esila na ngalaba na-elekọta ndị Naịjirịa bi n’ofesi bụ NIDCOM zigara ezinaụlọ otu nwoke Naịjirịa nwụrụ na mba Saụt Afrịka ozo itiakanobi.

Onyeisi ngalaba ahu bụ Abike Dabiri Erewa gwara ezinaụlọ Echefu na ezi nyocha na-aga n’ihu gbasara ọnwụ nwoke ahụ bụ nke ndị ohi gbagburu n’ọdọahịa ya dị na Saut Afrịka.

Onye nnọchite anya ngalaba ahụ bụ Andrew Idi gara leta ezinaụlọ nwoke ahụ ma na-enye aka ịbulata ozu ya na Naịjriị ili ya.

Dabiri Erewa gwakwara gọọmentị ndị Saụt Afrịka ha gba mbọ hụ na enyochapụtara ndị gburu Echefu ma mee ka ọ ghara ịdị ka ọnwụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ nwụrụ na nkịtị.

Michael Chima Echefu bụ onye na-azụ ahịa na Saụt Afrịka tupu ọ nwụọ. Ọ hapụrụ nwunye ya bụ Ugochi Echefu na ụmụ atọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *