Take a fresh look at your lifestyle.

Onye isi ala bụ Muhammadu Buhari toro ndị agha nchekwa nke obodo a maka nzuoke.

Nokai Origin dere ya na bekee.

0 491

Onye isi ala bụ Muhammadu Buhari toro ndị agha nchekwa nke obodo a maka nzuoke.

 

Onye isi ndị agha Naịjirịa ma bụrụkwa  Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari etoola ọrụ dị mkpa nke ndị agha Naịjirịa na-arụ n’ime obodo a ka e were nwee nchekwa.

Onyeisiala Buhari kwuru okwu a n’ mmemme ụbọchị ndị agha Naịjirịa nke afọ 2022, (NADCEL) e mere na Owerri, Imo steeti.

Onye isi ala Buhari kwuru na kemgbe mmalite nke ndị agha na 1863, ọ gbanweela ka ọ bụrụ ndị ọkachamara na-arụ ọrụ nke ọma.Ma bụrụkwa ndi zuru oke ma tozue etozu n’ọrụ na mpaghara a ma n’ụwa nile gbaa gburugburu.

EKELE

Mgbe ọ na- ekele maka ọrụ  nke ndị dike nile a rụrụ  n’oge gara aga ,ma ndi dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ n’ime ha tinyere aja ha chụrụ site n’ezi ọrụ ha.Onyeisiala Buhari kelere ndị uweojii na ndị agha maka iguzosi ike n’ihe ha  n’ Iwu nke Federal Republic of Nigeria.

Gọvanọ  Steeti Imo bụ Hope Uzodinma bụ onye nọkwa na mmemme ahụ kelere ọchịchị ndị agha Naijiria maka ikike nnabata nke NADCEL 2022.

Onye isi ala Buhari nke onye nọchitere anya ya bụ Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa, Major General Bashir Magashi (Rtd).

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *