Take a fresh look at your lifestyle.

Eucharia Anunobi ekwuola nke bụ eziokwu gbasara akụkọ agbamakwụkwọ ya na-ewu ugbua.

0 170

Dịka a akụkọ a siri kwuo, ya bụ agbamakwụkwọ kwesiri ịdị n’etiti ya na otu nwaokorobịa gbara afọ iri abuo na asaa nke a sị aha ya bụ Lucky Oparah.

Ya bụ akụkọ kwukwara na agbamakwụkwọ ahụ ga-adị n’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Jun afọ 2022.

“Ọ bụrụ na m na-akwado ịme agbamakwụkwọ, unu gara anụ maka ya kemgbe,” Anunobi, onye bụkwa ọkammụta na onye oziọma ụka Kraist, gwara ndi ntaakụkọ.

“Ihe a bụ atụmatụ ndị ọjọọ chọrọ ịmetọ aha m dịka onye na-eme ejije nakwa onye nọ n’isi ụka Kraịst”

Anunobi gara n’ihu kọwaa na ọlụbeghị di ma kwuo na aha ọ na-aza ugbua bụ aha nna ya.

Na mkparịtaụka ya na ntaakụkọ Igbo nwere n’afọ 2020, o tinyere ọnụ n’okwu alụmdinanwunye ma kwuo ka ndị mmadụ hie asaa n’anya tupu ha abanye na ya bụ ihe.

O kwuru nke a maka ọnọdụ ahụike dulara nwa ya mmụọ bụ ‘Sickle Cell Anaemia’ na etu ya na nna nwa ahụ gara isi gbochie ọnọdụ a ma ọ bụrụ na ha leziri anya nke ọma tupu a mmụọ ya bụ nwa.

Leave A Reply

Your email address will not be published.