Take a fresh look at your lifestyle.

NSCDC azọpụtala ụmụnwanyi anọ ma jide ndi ntọri na Kwara  

0 519

Nwanyi gbara afọ iri atọ na asaa bụ onye ntọri nke aha ya bụ,Gift Rita ka anwụchiri bụ ndi Nigerian Security and Civil Defence Corps, NSCDC, na Steeti Kwara,mpagbara North Central ala Naijiria.

Ndi ọrụ NSCDC zoputakwara umuaka ndi nwanyi ano bụ ndi atọrọ na Port Harcourt eje Ilorin,ka amanye ha igba akwuna.

 Onye  state NSCDC Commandant bụ, Makinde Iskil Ayinla,mere ka amata nkea site n’ọnụ onye na ekwuchitere ha bụ,Babawale Zaid Afolabi .

Onye Commandant mere ka amata na ọbụ site na enyem aka ezi ụmụafọ ka anyim ji marar banyere onye ntọri a,nke tọrọ ụmụagboho anọ dina agbata afọ iri ise na afọ iri isii bụ ndi odubatara Ilorin site na PortHarcourt iji ha aga mgbere dika akwuna.

Onye Commandant a kwuru “ Gift Rita,bụ onye ntọri ụmụagboho anọ a nakwa ndi ọtọrọ ka enyefela n’aka ndi NAPTIP,nke Steeti Kwara maka iru oru ha etu okwesiri.

 Ebe onye State Commander nke  NAPTIP b, Saadu Mustapha, kwuru na inwụchi onye ntori a bụ maka njiko aka nke ndi ọrụ NSCDC.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *