Take a fresh look at your lifestyle.

Ghana gbapụrụ Naịjirịa n’iko mba ụwa afọ 2022 

0 717

Ghana na Naịjirịa gbara nhatanha site n’inye onwe ha otu goolu otu goolu.

Mana Ghana tozuru iso gbaa asọmpi Qatar 2022 n’ihi na ha nyere goolu n’Abuja mana Naịjirịa enyeteghị goolu oge ha gara Kumasi n’ụbọchị Fraịde,abali iri abuo na ise nke onwa Maachị.                                                                                                     Otu egwu  Super Eagles nke Naịjirịa akwarala ngwongwo ha laa maka na ha agaghị eso agba asọmpi iko mba ụwa nke ga-adị na mba Qatar n’ọnwa Nọvemba afọ 2022.

Ọ bụ ndi Black Stars nke mba Ghana ji azịza zapụ Naịjirịa n’asọmpi a dịka ha nyere onwe ha otu goolu otu goolu na aga nke abuo,bu nke were onodu na Abuja.

Naịjirịa na Ghana nyere onwe ha otu goolu otu goolu n’agba nke mbụ nke asọmpi itozu oke maka iko mbaụwa nke afọ 2022, n’ama egwuregwu dị n’Abuja.

Mba Ghana bu ụzọ nyete goolu na nkeji iri na otu nke asọmpi ahụ, site n’aka Thomas Partey.

Mana Naịjirịa nyere goolu nke ha site na penariti nke William Troost-Ekong gbara, dịka a gbaturu Ademola Lookman n’ime obi goolu ndị Ghana.

Cheta na Naịjirịa enyetaghị goolu oge ha gara Ghana n’ụbọchị Fraịde, abalị 25 nke ọnwa Maachị 2022.

Ọ pụtara na dịka Ghana bu ụzọ nyete goolu n’Abuja, ndị Naịjirịa kwesịrị imeri ha emeri iji gafere, maka na nhatanha ọbụla agaghị enwe isi.

Fifa nwere iwu a na-akpọ ‘away goals rule’, nke bụ na ọ bụrụ na a gbaa nhatanha n’asọmpi, ndị ọbụla kacha nyeta goolu n’ụlọ ndị nke ọzọ, ga-enwe mmeri.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *