Gịnị ka ‘ufie’ bụ?
Ufie bụ ngwa e ji akụrụ ndị Eze na ndi chiri echichi egwu n’ala Igbo.
E si n’osisi Ngwu akọpụta ya bụ ngwa egwu.
Ọ bụ sọọsọ ndị mụtara ya bụ ngwa egwu na-eti ya.
Ọ bụ sọọsọ ndị echiri echichi ka a na-akụrụ ya bụ ngwa egwu a
Ufie bụ Ikoro pụruiche a na-akụkarị na Mbaukwu, Anambra steeti.
Ihe ngwaegwu a ji pụọ iche bụ na ikoro ndị ọzọ na-adịna ala mana Ufie na-akwụ ọtọ.
Ngwaegwu na-alazị ala maka na “e rukwaghị mmadụ ise n’akụ ya n’ala Igbo”.
Ọ na-atụkwa ya bu ekwe bụ nke o ji Oke osisi ngwu atụ.
Ngwụ bụ oke osisi n’ala Igbo nke pụtara na onye ji ya atụ ya bụ ekwa na-akpachapụ anya ya.
onye ahụ kwesiri ịdowe onwe ya asọ.
Nwaanyị anaghị atụ ufie mana o nwereike ịyọ ịchaka e ji a akụ ya bụ egwu.
Leave a Reply