Take a fresh look at your lifestyle.

ICPC anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu ndị mmadụ n’Imo steeti

0 229

Ndị ọrụ Independent Corrupt Practices Commission bụ ICPC n’ịchafụ ekwuola na ha anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu mmadụ na ntuliaka e mere n’Imo steeti.

Ngalaba ahụ depụtara n’akara X (bụbu Twitter) ha na ndị ọrụ ha nwụchiri ndị mmadụ n’ọgbọ ntuliaka asaa ma jichie nde naira anọ.

Ha sị na otu onye n’ime ndị ha nwụchiri ji akwụkwọ ebe e dere aha nakwa akara ekwentị ndị na-atụ vootu.

“Ndị niile anyị nwụchiri nọ n’aka anyị ugbua, anyị edetuola aha ha na okwu akaebe ha” ka ha dere.

Ha sị kwa na ha atọhapụla ndị ahụ nwamgbenta dịka nyocha ka na-aga n’ihu.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *