Take a fresh look at your lifestyle.

Pope Leo XIV ekwupụtala iwe ya maka mwakpo ndị omekome n’ebe dị icheiche na Naịjirịa

0 127

Popu Leo XIV bụ onyeisi ụka Katọlik ekwupụtala iwe ya maka mwakpo ndị omekome na-eme n’ebe dị icheiche na Naịjirịa.

Popu Leo mere nke a ma kwuo na ya na-atụ anya na ndị ọchịchị na Naịjirịa ga-agba mbọ chekwaa onye ọbụla.

Popu Leo kpọrọ oku ka e tinye Naịjirịa n’ekpere.

N’okwu ya “ọ bụ n’iwe na obi ntiwa ka m ji anụ na e gburu ndị mmadụ n’ime obodo dị icheiche na Naịjirịa”.

Popu kwuru nke a dịka e kpechara ekpere Angelus nke ehihe.

Cheta na kamgbe Jenuwarị na ndị omekome egbuola ọtụtụ ndị mmadụ na steeti dị icheiche na Naịjirịa ọkachasị na Kwara steeti.

Popu kwuru sị ‘ihe na-emetụta ndị niile ọnọdụ ọgbaaghara nakwa mwakpo ndị na-enyi ọha egwu na-emetụta m”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *