Take a fresh look at your lifestyle.

Akụkọ kwuru na anyị machiri onye nọ mahadum ile ule Jamb bụ akụkọ ụgha – Jamb

0 64

Ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanye mahadum bụ Joint Matriculation Board(JAMB) ekwuola na ọ bụghị ịda iwu ma onye nọ mahadum debanye aha ya maka ule ịbanye mahadum.

Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na Jamb chọrọ ka ndị nọrọla na mahadum gbaghapụ ohere agụmakwụkwọ ha nwerela tupu ha enwee ohere ilegharị ule mbata mahadum.

Mana n’ozi nke ụlọọrụ ahụ wepụtara n’akara obaozi X ụbọchị Wenezde, Jamb kwuru sị na otu onye agaghị enwe ohere agụmakwụkwọ n’ebe abụọ otu mgbe.

Ozi ahụ sịrị: “O bụghị ịda iwu onye nọ na mahadum idenye aha maka ule UME/DE. Mana ịhapụ ikwupụta nke a bụ ịda iwu. Ịgba n’anwụ na ngwangwa onye ahụ nwetara ohere agụmakwụkwọ ọhụrụ ọzọ, nke ochie eme.”

Jamb rụtụrụ aka na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ewerela ile ule dịka akaọrụ, ma sị na atụmatụ ọhụrụ ahụ bụ iji kụọrọ ndị dị otu ahịa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *