Senegal ga-ezute Morocco, na njedebe nke asọmpi 2025 CAF Africa Cup of Nations (AFCON),Morocco, bụ ndị na-akwado asọmpi ahụ n’ala ha,
Morocco meriri Nigeria 4–2 site na penọltị, ka egwuregwu kwụsịrị 0–0 ọbụna mgbe oge mgbakwunye gasịrị. Nke a nyere ha ohere ha ịbanye na ngwucha ,
Senegal nwetara tiketi ha ịlaghachi na ngwucha AFCON site na mmeri dị ntakịrị 1–0 megide Egypt, nke mechiri olileanya ndị Pharaohs ịnweta aha asọmpi kọntinent nke asatọ ha ga-agbatị rekord.
N’ụbọchị Sọnde, 18 Jenụwarị, na Ama egwuregwu Prince Moulay Abdellah dị na Rabat ka Morocco na Senegal ga-egosi ihe ha ji eko.Oge a ka a ga-ama ndi nwee iko a .
Leave a Reply