Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere aha Daniel Bwala ji ewu

0 133

Kemgbe ihe ruru abalị atọ, aha ọnụ na-ekwuru onyeisiala Bola Tinubu na-ewu na soshal midịa dịka ya na otu onye ntaakụkọ nwechara mkparịtaụka.

Daniel Bwala bụ onye ndụmọdụ mgbasaozi nke Onyeisiala Tinubu na onye ntaakụkọ Mehdi Hasan nwere mkparịtaụka, ebe Hasan chetaara Bwala ụfọdụ ihe o kwuru n’oge gara aga banyere Onyeisiala Tinubu mana Bwala gọrọ sị na ya ekwughị ihe ndị a.

Iji maa atụ, Hasan jụrụ ya sị, “Onye kwuru na Tinubu nyere aka kewapụta otu agha nnupụisi?”

“Bwala sara ya sị, “O nweghị mgbe Tinubu kewapụtara ndịagha nnupụisi. Tinubu so n’otu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa kachasị nwee agba.”

Hassan jụkwara ya ọzọ sị, “Tinubu na ndị otu ya kewapụtara otu agha nnupụisi.’ Onye kwuru nke a?”

Ka m jụkwaa gị nke ugboro atọ, “Tinubu na ndị otu ya kewapụtara otu ndịagha nnupụisi.” Onye kwuru nke a?”

Bwala sara sị, “Tinubu enweghị mgbe o kwewapụtara otu agha nnupụisi.”

Mehdi sara, “Gịnị mekwara iji kwuo n’abalị 22 nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2023 na o kewapụtara ndịagha nnupụisi?”

“O nweghị mgbe m kwuru etu ahụ,” ka Bwala zaghachiri.

Mehdi jụkwara ya sị, “o nwere otu agha nnupụisi gbalịrị igbu gị?”

Bwala sara sị, “O nweghị. O nweghị mgbe m kwuru na ọ chọrọ igbu m.”

Onye zọburu ọkwa onyeisiala n’aha otu YPP bụ Kingsley Moghalu kwuru sị, “Mkparịtaụka Daniel Bwala mechuru Naịjirịa, Onyeisiala Tinubu nakwa Bwala n’onwe ya ihu na mbaụwa.”

O kwuru na ihe o mere gosiri na na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa “enweghị ihe ha kwenyere na ya karịa ihe ha ga-erite nakwa agha onye ga-enweta ọkwa ọchịchị.”

Kemgbe ihe onyonyoo ahụ pụtara, ọtụtụ ụmụ Naịjirịa akatọọla Bwala maka ihe ndị o kwuru oge gara aga dịka ụfọdụ gara wepụta ihe onyonyo ebe ndị o kwuru ya.

Mana n’ozi o wepụtara ụbọchị Fraịde 6 Maachị 2026, Bwala kwuru na okwu ndị a niile o kwuru banyere Tinubu bụ “okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *