Take a fresh look at your lifestyle.

Ụgbọelu Arik Air si Legọs aga Pọtakọt enweela nsogbu injini

0 78

Ụgbọelu Arik Air si Legọs aga Pọtakọt gbalahụrụ ihe mberede dịka o nwere nsogbu injini ụbọchị Wenezde.

Nsogbu ahụ mere ka ya bụ ụgboelu gaa kwụsị na ntụmadị n’ọdọụgbọelu Bini taa.

Mana o nweghị onye merụrụ na ndapụta ahụ.

Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka inyocha na ije awale bụ ‘Nigerian Safety Investigation Bureau kwuru na ya bụ ihe mere n’ezie n’ozi ha wepụtara n’akara n’ọbaọzi X.”Ụlọọrụ ‘Nigerian Safety Investigation Bureau na-ekwu n’ezie na ụlọelu Arik Air bu akara B737-7GL (5N-MJF) si Legọs aga Pọtakọt nwere nsogbu injini dịka ọ na-efe were ka kwụsị na Benini.”

Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na onweghị ihe mere ụgbọelu ma ndị njem.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *