Onye bụbu Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị bụ Uju Kennedy-Ohanenye ekwuola na o nweghị ihe mwute maka mwepụ onyeisiala Naịjrịa bụ Bola Tinubu wepụrụ ya dịka minista.
O kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakukọ ụlọmgbasaozi na-enwe mkparịtaụka, bụ ebe ọ kọwara ihe ndị ọ rụrụ mgbe ọ ka nọ n’oche dịka minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị.
O kwuru na onyeisiala Tinubu na ndị gọvanọ na-arụ ọrụ mana ọ maghị ihe ndị Naịjirịa na-eme, maka na onye chọọ ka Naịjirịa rụọ ọrụ, onye ahụ ga-agbadọ ụkwụ na-ala.
Kennedy Ohanenye mere ka o doo anya na mgbe ọ nọ n’ọrụ, o nweghị ihe na-adịghị mma n’ọrụ ndị a sị ya rụọ.
Dịka o siri kwuo, “Obi dị m mma n’ọrụ ndị m rụrụ mgbe m ka nọ n’ọrụ, ya mere i lee m anya ọfụma ị ga-ahụ na ahụ dị m mma”
“Apụọla m n’ọrụ dịka minista, ihe ọ bụla ha na-eme ebe ahụ ugbua gbasara ha.”
Mgbe a jụrụ ya ma obi ọ dị ya mma na mwepụ e wepụrụ ya n’agbanyeghị ọrụ ọma ndị ọ rụrụ, ọ kọwara na ihe gbasara mkpebi ndọrọndọrọ ọchịchị bụ nke dị omimi nke ndị ọha agaghị aghọta.
“Mụ na onyeisiala Tinubu ka na-ekwu okwu ruo ugbua. Obi dị Tinubu mma etu m si rụọ ọrụ, o nwereike e nwere ihe karịrị ya ike merenụ”.
Leave a Reply