E nwere ihe ndọghachiazụ n’ikpe a na-ekpe ndị a na-enyo enyo na ha gburu onye ntaakụkọ Arise News bụ Somtochukwu Maduagwu na onye nche bụ Barnabas Danlami.
Ihe ndọghachiazụ a dapụtara n’ụbọchị Mọnde 9 Febụwarị 2026 dịka ụlomkpọrọ kụrụ afọ n’ala ịkpọta ndị na-azara ọnụ ha n’ụlọikpe.
Ọ bụ oge a malitere ịnụrụ ikpe ahụ n’Ụlọikpe Ukwu nke Isi Obodo ka Ọkaiwu na-ekpe ikpe bụ Adama Musa gwara ụlọikpe na ndị a na-ekpe ikpe abịaghị n’agbanyeghị na ndị Ọkaiwu ha bịara.
Musa gosiri obi mgbawa dịka o kwuru na ndị ọrụ ụlọmkpọrọ sị na ha amaghị na ikpe ha bụ n’ụbọchị 9 Febụwarị, n’agbanyeghị na ndị akaebe anọ dị njikere ịgba ama.
Iji dozie ọnọdụ a, Ọkaikpe Mohammed Idris tinyeziri ikpe a n’ụbọchị Tuzde 10 Febụwarị 2026 ma gwa ndị akaebe ka ha gbaa mbọ bịa ụlọikpe iji hụ na e nwetara ikpe ziri ezi.
Ọkaikpe Idris nyekwara iwu ka e mee ka ozi a ruo ndị mkpọrọ aka iji hụ na ha kpọtara ndị na-azara ọnụ ha n’ụlọikpe.
Leave a Reply