Nuhu Ribadu bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nke Onyeisiala Naịjirịa ekwuola etu gọọmentị Naịjirịa si ahụta mkpaịtaụka ha na Amerịka na-enwe maka tigbuo zogbuo maọbụ mwakpo a na-awakpo ọtụtụ obodo.
Nuhu Ribadu ji akara X soshal mịdịa ya mee ka a mara nke a dịka Amerịka na Naịjirịa nnwere nzụkọ mbụ n’Abuja.
N’okwu ya “kamgbe ngwụcha afọ 2025, mmekọ mba Amerịka na Naịjirịa esila na mkparịtaụka banye n’imepụta ihe a na-ahụ anya, ihe bara uru, ma na-echekwa ndị nkịtị.
Gọọmenti Onyeisiala Bola Tinubu na-eme ọkpụrụkpụ ihe banyere ngaraba nchekwa, ikpe nkwụmọtọ na ime ihe e kwesiri ime na ngalaba dị ciheiche.
Naịjirịa nwere mmasị na mkparịtaụka, inwe mpụtara a ga-ama etu e si mepụta ya, ijịkọta ọnụ, ntụkwasị obi nakwa ichekwa onyeọbụla na obodo niile.
Cheta na odeakwụkwọ na-ahụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Amerịka bụ Allison Hooker nochitere anya mba ha n’ọgbakọ ahụ nke a kpọrọ “US-Nigeria Joint Working Group” e mere n’Abuja na nsonso a.
Hooker kwuru na ọgbakọ ahụ bụ ka a kpaa etu mba abụọ ahụ ga-esi arụkọ iji hụ na tigbuo-zogbuo megide ndị ụka Kraịstị kwụsịrị na Naịjirịa.
Leave a Reply