Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla ọkaiwu Mike Ozekhome n’ụlọikpe maka ebubo mpụ na nrụrụaka

0 164

Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla ọkaiwu a ma ama bụ bụ Mike Ozekhome ụlọikpe maka ebubo gbadoro ụkwụ na mpụ na igosi ụlọikpe akwụkwọ adịgboroja na Lọndọn.

Ụlọọrụ Iindependent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) kpụpụrụ Ọkaiwu Mike Ozekhome Ụlọikpe dị Ukwu dị n’Abuja maka ebubo ọnụ ọgụgụ dị atọ gunyere ịtụ asị banyere etu o si nweta ụlọ ya dị na 79 Randall Avenue Lọndọn

Ụlọọrụ ICPC kwuru na Ọkaiwu Ozekhome kwuru na ọ bụ Shani Tali nyere ya ụlọ ahụ.

Mana nchọpụta e mere gosiri na Ozekhome rụrụ akwụkwọ njirimara paspọt Naịjirịa adịgboroja nwere aha Shani Tali na akara A07535463 iji nwee kwado asị ahụ ọ tụrụ.

Ụlọọrụ ICPC mere ka o doo anya na agwa dị etu a megidere iwu Naịjirịa.

E kwubeghị mgbe ikpe ya ga-amalite.

Mana ka ọ dị ugbua, ndi ntakIgbo achọpụtabeghị nke bụ eziokwu n’ihi na Ọkaiwu Mike Ozekhome azaghị oku ekwentị anyị kpọrọ ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *