Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Ekeleela Onyendu Kọstọm Maka Agbamafọ Iri Isii

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 170

 

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekeleela onyeisi nke kọstọm ala Naijiria (NCS), Dọkinta Adewale Adeniyi, na ncheta ụbọchị ọmụmụ ya afọ iri isii gara aga, ma kọwaa ya dị ka onye ọrụ ọha na eze nke kwụdosiri ike. Onye wetara mgbanwe mere ka azụmaahịa na usoro ego mba ahụ sikwuo ike.

N’ozi ekele nke onye na-ekwuchitere onyeisiala, Maazị Bayo Onanuga, nyere na Sọnde, onyeisiala nwere obi ụtọ na Adeniyi maka ihe mmejupụta ahụ.

O kwupụtara na ogologo afọ nkwụdosi ike n’ọrụ ya, ya na ịchụso ihe dị mma emeela ka ọrụ kọstọm ahụ dịghachi mma ma nyekwa ohere ịdị mma karịa.

Onyeisiala Tinubu kwuru na n’okpuru nduzi Adeniyi, NCS edeela mgbanwe dị ịrịba ama, meziwanye mmekọrịta obodo, kwalite mmepụta ego ma melite mmekọrịta azụmaahịa Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

Onyeisiala kọwakwara ọrụ Adeniyi n’ịgbanwe ụlọ ọrụ ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ọrụ asọmpi zuru ụwa ọnụ, nke mechara ruo ibuli ya n’ọkwa ya dịka Onyeisi oche nke otu ọrụ Kọstọm mba ụwa a kpọrọ World Customs Organisation (WCO) n’ọnwa Juun afọ 2025.

Onyeisiala Tinubu tokwara Onyeisi ụlọ ọrụ Kọstọm ahụ maka ịnọgide na-egosi na Naịjirịa na Afrịka na-aga n’ihu n’ụwa niile site n’ịduzi ndị mmadụ, ndị bara uru na ndị nwere mmasị na WCO.

Ka Adeniyi na-eme emume ncheta ọmụmụ ya nke afọ iri isii n’abali iri na itoolu ọnwa Jenụwarị, Onyeisiala Tinubu kpere ekpere maka ike ọhụrụ, ahụike na amamihe ka ọ nọgide na-ejere mba ahụ ozi.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *