Take a fresh look at your lifestyle.

Minista FCT:gọọmenti etiti ekwela ndị na-arụ ọrụ mkpofu nkwa .

Foluke Ibitomi dere ya na bekee.

0 458

 

Maazi Fred Kpakol,  nnukwu onye inye aka nke  e jiri Senior Special Assistant (SSA)  na bekee nye Minista FCT, Nyesom Wike maka gburugburu na  nchekwa mkpofu ihe  kwuru  na Fraịde na Abuja  na gọọmenti etiti ekwela ndị na-arụ ọrụ mkpofu nkwa  na ha ga-akwụ ụgwọ ọrụ mkpofu ngwa ngwa iji hụ na ga-edebe gburu F.C.T ọcha .

Ọ gwara ndị ọrụ ahụ ka ha nọgide na-agbasi mbọ ike na-arụ ọrụ ha na  ha ga-akwụ ụgwọ ha n’egbughị oge.

Obi di ndị ọrụ ngo ahụ mma na Wike na-agbaa ha ume ka ha were  gosipụta uru na ọrụ nlekọta mkpofu bara.

Mazị Ibrahim Babayo, onye isi oche otu ndị na-arụkọ ọrụ na-ehicha ihe mkpofu nke FCT mere mkpesa maka ịkwụ ụgwọ ụgwọ ọnwa n’egbughị oge n’ihi mmụba nke mmanụ ọkụ na mmanụ dizel.

SSA kwere ndị ọrụ nkwekọrịta nkwa na a ga-akwụ ụgwọ niile pụtara ìhè n’oge na-adịghị anya iji kwado ọrụ ha.

Babayo toro Kpakol maka ngwa ngwa o tinyere aka n’ihe ndị ọrụ ngo na-achọ ma kwekwa ndị bi na FCT ọrụ mkpofu dị irè.

Mazị Osi Braimah, onye isi ụlọ ọrụ AEPB gwara ndị ọrụ ngo ka ha tụba uche n’ụzọ ha ga-esi hụ na gburugburu ebe dị ọcha na FCT.

Braimah kwuru na ọ bụ ihe kacha mkpa iji nweta ebe dị ọcha na nchekwa na FCT maka ndị bi na ndị mba ọzọ.

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *