Oge mmiri ozuzo: Ndị na-anya nnukwu ụgbọ ala eji ebu mmanụ na-akpọ oku maka mmezigharị okporo uzo
Bilkisu Halilu Pai dere ya na bekee.
Oge mmiri ozuzo: Ndị na-anya nnukwu ụgbọ ala eji ebu mmanụ na-akpọ oku maka mmezigharị okporo uzo
Otu ndị na-anya ụgbọ ala mmanụ ala akpọkuola Gọọmenti Naịjirịa ka ha gbasie mbọ ike ma gaa n’ihu na-arụkwa nnukwu okporo ụzọ tupu oge mmiri ozuzo amalite .
Onye isi oche nke otu ahụ, Alaka Kaduna, Maazị Abdulsalam Mohammed, mere arịrịọ a na nzụkọ Zonal na Steeti Sokoto.
Dị ka o si kwuo, ọnọdụ okporo ụzọ na-emekarị ka ọ sie ike ibufe ngwaahịa mmanụ ala n’ebe dị iche iche n’oge mmiri ozuzo.
“Ọnọdụ okporo ụzọ na Naijiria na-eme ka ọ na-esiri ndị òtù anyị ike ịrụ ọrụ ha nke ọma.
Ọ kpọkukwara ndị otu ka ha kwụsị ịnya ụgbọ ala n’abalị.
Leave a Reply