Take a fresh look at your lifestyle.

Onye isi oche APGA n’ala Naijiria kelere ndị Alakụba maka Eid-Al-Fitr.

Nnenna Okoronkwo dere ya na bekee.

0 350

Onye isi oche APGA n’ala Naijiria na-eme mmemme ndị Alakụba bụ Eid-Al-Fitr.
Onye isi oche otu All Progressives Grand Alliance (APGA), Dr Victor Oye, enyela ndị otu Muslim na Naijiria ekele dị ụtọ maka mmemme Eid-al-fitr nke 2023.
Na ozi na Fraịde, Nwamadi a kelere ndị Alakụba maka mmezu oke ọnụ nke Ramadan.
O kwuru na ndị Alakụba kwesịrị ịrapagidesi ike n’ihe mmụta ha mụtara n’ime ogologo oge a na-ebu ọnụ ma tinye ha n’ọrụ maka mmepe obodo.
Onye isi oche APGA kwara ụta maka ihe isi ike ụmụ amaala gabigara n’oge na-adịbeghị anya ma kpọkuo mmadụ niile ka ha gbasie mbọ ike ka obodo dị n’otu, nwee ọganihu ,akụ na ụba na nchekwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *