Take a fresh look at your lifestyle.

Ụbọchị mwepụta AMCVA maka onyinye nturu ugo mbipụta nke itoolu nke 2023.

Oluchi Okwuego dere ya na bekee.

0 504

 

Ụbọchị mwepụta AMCVA maka onyinye nturu ugo mbipụta nke itoolu nke 2023.

The Africa Magic Viewers Choice Awards, (AMVCA), ekwuputala ụbọchị maka mbipụta 2023, na Mee 18 – 20, 2023, na Legoosi Naijiria.

Ọ bụ onye isi ngalaba na-ahụ maka ọdịnaya na  ọdịda anyanwụ africa na multichoice nigeria amvca bụ Dr. Busola Tejumola kwupụtara nke a.

O kwuru na, mmemme a ga-abụ emume ụbọchị atọ . A ga-enwe isi ihe nrite na Mee 20, 2023.

Nkwupụta nke nhọpụta ga-ewere ọnọdụ na Eprel 9, ka ọ si kwuo.

Agba ikpeazụ nke ihe nrite ndị e mere na Eko Hotel & Suites, Legọọsi n’afọ gara aga, ka Stan Nze na Osas Ighodaro nwetara mmeri nke onye na-eme ihe nkiri kachasị mma .

Ndị na-eme ihe nkiri ndị gara ụlọ na ihe nrite AMVCA na mbipụta ikpeazụ gụnyere Funke Akindele, onye meriri nke ụmụnwanyi kachasị mma na ihe nkiri, na Samuel Perry aka Broda Shaggi, onye meriri maka ụdị nwoke nke otu ụdị ahụ.

Leave A Reply

Your email address will not be published.