Take a fresh look at your lifestyle.

Siminialayi Fubura Meriri Ntuliaka Gọvanọ Steeti Rivers

Nnenna Okoronkwo dere ya na bekee

0 371

Onye na-azọ ọkwa pati People’s Democratic Party PDP, Siminialayi Fubara emeriela ntuliaka gọvanọ steeti Rivers.

Onye na-ekwupụta mpụtara nke National Electoral Commission (INEC) na steeti Rivers, na onye isi nke Federal University of Petroleum Resources, Prọfesọ Akpofura Rim-Rukeh, kwupụtara nsonaazụ na Tuzdee na Port Harcourt, isi obodo steeti ahụ.

Rim-Rukeh kwuru na Fubura jiri vootu dị 302,614 were merie ndị so sọọ mpi ahụ.

Onye na-esochi ya anya, Tonye Cole nke All Progressives Congress (APC), nwetara vootu 95,274 ebe Magnus Abe nke Social Democratic Party (SDP) nwetara vootu 46,981 na Beatrice Itubo nke Labour Party (LP) nwetara vootu 22,224.

Voice of Nigeria kọwara na steeti ahụ nwere mmadụ 3,537,190 debara aha ịtụ vootu, 496,852 ndị e nyere ikike ịtụ vootu, vootu 494,604 ka a tụrụ atụ ebe vootu 483,934 ziri ezi.

“Mụ, Prọfesọ Akpofura Rim-Rukeh, onye isi Federal University of Petroleum Resources, na-ekwupụta ugbu a nsonaazụ ntuli aka gọvanọ 2023 emere na 18th nke Maachị, 2023.

Rim-Rukeh kwuru, “Na Fubara Siminialayi nke PDP nwetara vootu kachasị elu yana nweta pasentị akwadoro, ma mejupụta ihe iwu chọrọ ka a na-ekwupụta na ọ bụ onye mmeri ma weghachi ya,”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *