Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Buhari Ekeleela Ndị Ọkụ Gbara N’ahịa Lagos

0 339

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ya ji obi mwute mata maka ọnwụ onye ọrụ nchekwa dị afọ iri isii na ise, mfu nke ụfọdụ ndị Naijiria na-arụsi ọrụ ike na ihe ha ji ebi ndụ n’ahịa Akere Spare Parts dị na Apapa Ajegunle na Lagos Steeti.

Dịka onye enyemaka pụrụiche nke Onyeisiala na mgbasa ozi siri kwuo, Onyeisiala gosipụtara ọmịiko ya nke ukwuu n’ebe ndị ahịa ahụ na ezinaụlọ ha nọ, “ndị na-ata ahụhụ nke ọnọdụ ọjọọ a ma nọrọkwa n’amaghị ihe ha ga-eme na ndọghachi azụ nwa oge a.”

Onyeisiala Buhari kwuru na o chegbukwara ya maka ọkụ ọgbụgba yiri nke a, nke mere n’ahịa Balogun a ma ama n’izuụka ole na ole gara aga, kpọkuzie ndị ọchịchị ka ha kpachapụ anya iji kwụsị ọgbaghara a.

Ka a na-enyocha oke na ihe kpatara mmebi ahụ, Onyeisiala Buhari toro ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Lagos steeti maka ịgbata ọsọ enyemaka, mazọputa ọdụ mmanụ ụgbọala na ụlọ ndị dị nso ebe ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *