Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria Emepeela Akwa Mmiri Niger Nke Abụọ Maka Mmemme Yuletide

Chioma Eche dere ya na Bekee

0 278

Ekwuwapụtala mmeghe akwa mmiri Niger nke abụọ ruo otu ọnwa maka mmemme oge Yuletide.

Mịnịsta Naijiria na-ahụ maka ọrụ, Maazị Babatunde Fashola, nyere iwu ka e meghee akwa mmiri ahụ site n’elekere iri na abụọ nke abalị iri na anọ nke ọnwa Disemba mgbe ọ nyochachara ihe enyemaka etinyere iji mee ka okporo ụzọ ahụ dị mma ụgbọ ala ịgba n’elu ya.

Ịdọ Aka Na Ntị Maka Ịgba Oke Ọsọ

Fashola, bụ onye mere njem gburugburu akwa mmiri ahụ mgbe ọ na-enyocha ya, dụrụ ndị na-agba n’okporo ụzọ ọdụ ka ha jiri nwayọọ na-anya ụgbọ ala n’enweghị nsogbu ka ha wee ghara imebi ebumnobi e ji rụọ akwa ahụ.

Mịnịsta a mere ka ọ pụta ihe na ebumnobi Onyeisiala Muhammadu Buhari ji rụchapụ akwa mmiri ahụ bụ ịzọpụta ndụ na ibelata ụbịam na-esite na ịla ọtụtụ awa n’iyi n’ihi mkpọchi ụzọ a na-enwe n’akwa mmiri Niger mbụ.

O kwuru na mmeghe akwa mmiri Niger nke abụọ ga-ebelata nhụjuanya nke ndị na-anya ụgbọ ala bụ ndị na-enwekarị mkpọchi ụzọ n’oge Yuletide.

O kwuru na ọ ga-abụ ihe ịla n’iyi ma ọ bụrụ na ndị na-eme njem n’elu akwa mmiri a akpachapụghị anya ma dọtara onwe ha ihe ọjọọ na-enweghị isi.

“Mpụtara ya bụ ihe anyị na-ahụ mgbe ndị mmadụ na-ekwu banyere ụbịam; akụkụ kasị ukwuu na ya abụghị ubịam ego; kama ọ bụ ịda ogbenye multidimensional.

“Iji ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ na-agbalị ịgafe akwa mmiri bụ ịda ogbenye. Nke a kwesịrị iwe naanị nkeji ole na ole ka ị nwee ike ịga mee ihe ndị ọzọ bara uru”. O kwuru.

Dị ka o si kwuo, “Onyeisiala Buhari  kwadoro na ebe ọ bụ na ọrụ akwa mmiri a gwụchaara, anyị kwesịrị ịkepụta okporo ụzọ n’oge ekeresimesi ka ndị mmadụ wee nwee ike ịmalite ịhụ ihe ọ ga-adị ka ya ịgbafe akwa mmiri a” Ọ kọwara.

N’ikwu okwu banyere mkpa ọ dị ndị na-anya ụgbọ ala irube isi n’iwu okporo ụzọ. Onyeisiala ga-enwe obi ụtọ ịhụ ka ndị na-anya ụgbọ ala n’enweghị nsogbu mgbe ha na-agba
n’ụzọ a, karịsịa n’oge ekeresimesi na afọ ọhụrụ.

“Ọ ga-emeghe maka ndị njem na-esi n’ebe ọdịda anyanwụ gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ site na abalị Disemba iri na ise, 2022, ruo abalị iri na ise Jenụwarị, 2023.

“Ka m dokwuo anya ọzọ; anyị arụchabeghị ọrụ owuwu n’akwa mmiri ahụ, ma anyị ga-emeghe ya iji belata nrụgide site n’otu akwa mmiri”.

Toll Plaza

N’ikwu okwu gbasara toll gate, Minista ahụ kwusiri ike na toll gate ga-emeghe, mana ọ nweghị ego a ga-anakọtara. Ọ chetaara ọha na eze ka ha ghara ịkwụ onye ọ bụla ego, n’ihi na ọ bụ n’efu n’oge a.

 

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *