Take a fresh look at your lifestyle.

Guinea Bissau ga-enye onyeisiala Naijiria Nkwanye Ugwu

Timothy Choji dere ya na Bekee

0 453

Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari bụ onye a ga-anọ na mba Giunea Bissau na Wenezde kwanyere ugwu kacha elu nke mba ahụ maka nkwado ọ na-enye maka nkwụdosi ike ndọrọndọrọ ọchịchị nke mba ahụ.

Onyeisiala Buhari ga-aza ọkpụkpọ oku nke onyeisiala Guinea Bissau, Umaro Embalo maka emume pụrụ iche nke a ga-eme n’ụlọ Onyeisiala, nke ga-agụnye mmepe okporo ụzọ nke a gụrụ aha ya, na Bissau, isi obodo mba ahụ.

Emume otu ụbọchị a ga-eme ka ọ pụta ihe bụ ọrụ Onyeisiala Buhari na West Coast, ọkachasị na Guinea Bissau, maka inye ndụmọdụ mgbe nile ma na-akpali ndị ndu banyere omume ọma nke udo, iguzosi ike n’ezi ihe na ịkpali akụ na ụba siri ike nke na-eweta ọganihu.

Nzukọ Mba na Mba

N’oge njem nleta a na Bissau, President Buhari na ndị nnọchiteanya nke Naijiria ga-esonye na nzụkọ mba abụọ ahụ.

Ndị ga-esonyere Onyeisiala na njem ahụ bụ mịnịsta nke steeti na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba, Zubairu Dada, Onye ndụmọdụ ọrụ nchekwa nke Naijiria, Maj. Gen. Babagana Monguno nke lara ezumike nka ya na onye isi nke National Intelligence Agency, Ahmed Rufai Abubakar.

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *