Take a fresh look at your lifestyle.

INEC Amapụtala Ihe karịrị Nde Dollar Narị Asatọ Maka Ntuliaka 2023

Edwin Akwueh

0 344

Ndị na-ahụ maka ntụliaka nke Naijiria, Independent National Electoral Commission (INEC), amapụtala ego karịrị nde dollar narị asatọ maka ntuliaka izugbe nke afọ 2023 na mmefu ego nke afọ ahụ.

Onye isi oche INEC, Mahmood Yakubu, mere ihe ngosi a n’ihu ndị Kọmitii nke sineti na-ahụ maka nkesa ego ka ụlọ omeiwu abụọ kwado ya n’ụbọchị Tuuzde.

Ka ọ dị ugbua, ụlọ omebeiwu akwadola ijeri narị naira atọ na ise maka ntụliaka izugbe afọ 2023. Agbanyeghị, INEC rịọrọ ka e nyekwuo ya ijeri naira iri ise maka mmefu ego n’afọ 2023.

Dịka Yakubu siri kwuo, ijeri narị naira atọ na ise bụ ego maka ntuliaka dị iche na ijeri naira iri anọ nke bụ ego mmefu kwa afọ nke ụlọ ọrụ ahụ.

N’ime mmefu ego 2023 nke e wegara na kọmitii Sineti na INEC ka ha lebaa anya, edoro ijeri naira abụọ na ụma isii maka ntuliaka gọvanọ nke dapụrụ n’oge na steeti Kogi, Imo na Bayelsa. Ntuli aka maka steeti atọ a ga-eme na Nọvemba 11, 2023.

Dị ka INEC si kwuo, ijeri naira abụọ na ụma isii ga-egbo mkpa maka ntụliaka, referenda, na mmefu dị ka ụgwọ ngalaba ọrụ, mbipụta akwụkwọ ntuliaka, mpempe akwụkwọ mpụtara, ibipụta fọm na envelopu, na mmefu ndị ọzọ.

N’ime mmefu ego 2023, ụlọ ọrụ ahụ ga-emefu nde naira iri ise zụta ngwa mgbanyụ ọkụ na ụgbọ ala. Nde 150 na nde naira 250 ga-abanye na ndozi ụlọ ọrụ na ụlọ obibi.

Onye isi INEC kwuru na ka ha wepụtara otu narị ijeri naịra n’ụlọ ọrụ ahụ n’ime ego ha ga-emefu, na ọ gaghị ezu maka nkwadebe zuru oke maka afọ 2023

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *