Sineti kwadoro Ariwoola ka ọ bụrụ onye ọka ikpe Naịjirịa.
Ụlọomeiwu Sineti akwadola nhọpụta ọkaikpe Olukayode Ariwoola dịka onye ọka ikpe Naịjirịa (CJN).
Nkwenye a sochiri nyocha ya na plenary na Abuja, isi obodo mba ahụ na Wednesde, Septemba 21, 2022.
Ariwoola, mgbe ọ na-aza ajụjụ tupu nkwenye ya kwuru na isi ihe ịma aka nke ụlọ ikpe bụ ezughị oke ego maka ọrụ ha.
O kwuru na a ga-enwerịrị ego a na-enye ndị ọrụ ikpe, na-ekwukwa na e kwesịghị ịhụ ndị ọkaikpe ka ndị na-arịọ arịrịọ.
Ariwoola gwara ndị sinetị ka ha na-enye nkwado ngwa ngwa mgbe niile na mmefu ego nke ụlọ ikpe ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ya.
Leave a Reply