Take a fresh look at your lifestyle.

A ga-akpọpụta aha onye meriri ntuliaka mba UK mgbe adịghị anya

0 547

Kemgbe izu ole maọle gara ugbua, Liz Truss nọ n’isi atụịmvootu onyeisiala mba UK.

N’ọnwa Ọgustu, YouGov kwuru na Liz Truss ji vootu dị pacenti iri isii na isuii aga Rishi Sunak bụ onye nwere pacenti iri ato na ano.

Mana a na-eche na ọ bụ ụlọọrụ ndị kalụkalụ bụ ndị nwe ọbaozi ahụ. N’ụtụtụ a ọbaozi Oddschecker  agbala afa na Truss nwere ohere ịzọta ọkwa onyeisiala ahụ otu ikpo n’ime ikpo narị (1/100) ebe ohere Sunak dị ikpo iri atọ na atọ n’ime otu (33/1).

Kedụ ndị bụ Liz Truss na Rishi Sunak?

O doola anya ugbua na e nwere mmadụ abụọ nọ n’isi ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisiala mba UK.

Ị nwereike ịhụgo ihu ha abụọ.

Mana ị maara ndị ha bụ?

Rishi Sunak

  • Rishi bụ bụ Chancellor na gọọmentị Boris Johnson ruo mgbe ọ gbara arụkwaghị m maka amaghị eme Boris.
  • Ọ bụ ya bụ onye kacha eti mkpu maka ịgbatikwu oge ịnọpụiche mgbe Covid 19 ma na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ mgbe ha nọ n’ụlọ.
  • Ndị uweojii dara ya nha maka ịda iwu nnọpụiche na Downing Street n’afọ 2020.
  • Ọji ego achụ ego so ebu agha gbasara aṅụghị mmanya na-aba n’anya bụ nke aha nwunye ya dara ụda nsonso a gbasara akwụghị ụtụisi ya.
  • O si na ndị chọrọ ịhazigharị akụnaụba mba Uk.

Liz Truss

  • Ọ bụ ya bụ Odeakwụkwọ mba ofesi ndị Uk na-esoghị gbaa arụkwaghị mgbe ọgbaghara dara n’isi Boris Johnson.
  • Ọ bụ ya ka afa ndị ọbaozi ndị Bookies sị na ọ ga-emeri na ntuliaka mba UK taa.
  • Ihe o ji amakarị atụ bụ na ya gara ụlọakwụkwọ gọọmentị steeti.
  • O sobụ n’otu Lib Dems bụ ndị na-akpọ oku ka emechie ọkwa Ezenwaanyị.
  • O so na ndị sị ka Britain ghara ịpụ na UK, mana ugbua ọ sị na ọdị mma ka ha siri pụọ.

Okeọnụ ngwaahịa bụ ihe chere onyeisiala mba UK ọhụrụ n’ihu

Otụtụ mmadụ na Westminster na-eche na Liz Truss ga-achịta aja na ntuliaka onyeisiala mba UK a taa.

Oburuladị ndị enyị Rishi Sunka na-ekwu na ọ bụ nwajaa ka ọ ga-eji daa ya bụ ntuliaka.

Ọ bụrụ na akpọpụta aha Truss dịka onyeisiala n’ehihie a, ihe mbụ ga-akpọ ya ihe bụ nsogbu ngwaahịa na-arị elụ ebe niile.

Ọ na-akwado itinye nnukwu ego n’aka ndị ndị mmadụ iji mee ka nsogbu belata.

Nke a gụnyere ịchabi ụtụisi nakwa inyere ezinaụlọ nakwa ụlọahịa ndị mmadụ aka.

Atụkwara anya ka o kwuo maka ihe ọ ga-eme iji mee ka ọkụ bụrụ anyụghị anyụ na UK n’ọdị n’ihu.

Ọ bụrụ na ya na ndị ọmeiwu kpachaa, ọ ga-amalite ịgwa ndị mmadụ okwu ozugbo.

Ihe a na-atụ anya n’aka ya bara ụba dịka ọke ọnụahịa ngwaahịa na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ.

Ndị otu pati Conservative na-echekwa maka ọdị n’ihu ha.

Otu onye otu Tory gwara onye ntaakụkwọ na “ọ bụrụ na anyị mee ka ọkụ bụrụ anyụanyụ, mara na anyị ga-anọ n’ọchịchị, mana ọ bụrụ na ha nweteghị ya, mara na nsogbu dị”.

Kedụ ihe meburu anyị jiri rute ebe a?

N’ụbọchị asaa nke ọnwa Julaị ka Boris Johnson sị na ya ga-arịda n’ọkwa dịka onyeisiala mba ahụ.

Nke a bịara dịka ọtụtụ ndị ọrụ ya tinyere akwụkwọ arụkwaghị na gọọmentị maka amaghị eme ya.

Ndị pati ya bụ Tory egbughị oge n’ịkpọ oku ka ndị mmadụ malite ịpụta maka ịzọ ya bụ ọkwa onyeisiala, ozugbo Boris Johnson tinyere akwụkwọ.

Na mbụ, mmadụ assatọ pụtara maka ya bụ ntụlịaka nke mbụ ebe a nọ kụchapụ Chancellor Nadhim Zahawi na onye bụbụ ọdeakwụkwọ ọrụ ahụ ike bụ Jeremy Hunt dịka ha nwetere obere vootu na-erughị iri atọ na patị Tory.

E meela ọtụtụ ntuliaka ndị ọzọ rụọ mere ka ọnụọgụ ndị na-azọ ya bụ ndọrọndọrọ jiri si asatọ gbadata abụọ – Rishi Sunak (nwoke) na Liz Truss (nwaanyị).

Liz meriri penny Mordaunt iji pụta ebe Sunak meriri ọtụtụ ndị pati ha bụ Tory iji pụta.

Ọtụtụ ihe agbanweela kemgbe ọnwa gara aga dịka ọ bụ ndị otu Tory mmadụ 160,000 ka ọ dị n’aka ịtụ vootu ga-ewepụta otu onye n’ime mmadụ abụọ a.

Ọ teela aka ọbaozi bookies gbara afa na ọ bụ Liz truss ga-emeri.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *