Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe nwere ike ibutere gi ọrịa akiri (kidney)

0 605

Ọtụtụ ndị ama ama anwụọla, ebe ụfọdụ ndị ọzọ gunyere onye otiegwu ụka na-ewu ewu nwụrụ na nso nso a site n’ọrịa akịrị.

Dịka ndị ọkacharmara ahụike akịrị (neprologists) si kọwaa, ihe ruru nde mmadụ iri abụọ na ise (25m) na Naijria nwere ọrịa ndakpọ akịrị.

Ọrịa akịrị na-adapụtakarị n’ọrịa shuga, ọbaramgalielu; na-eri nnukwu ego ọgwụgwọ ma na-atakwa onye ọ na-arịa ahụhụ ebe ọ dị ukwuu.

Mana ị nwere ike ịgbalahụ ya site na izere ụdị ndụ na-akpalite ya.

Dọkịta Ifeoma Ulasi bụ ọkammụta ahụike akịrị nakwa onye nkuzi na mahadum’College of Medicine, University of Nigeria, Enugu,kọwara ụdị agwa na-etinye ọtụtụ na nsogbu akịrị.

1. Iri oke nnu

Oke nnu na-ebute ọbara mgbalielu

Iri oke nnu na-ebute ọbaramgbalielu nke nwere ike imebi akịrị.

Dkta Ụlasị kwuru: “Nri anyị na-eri ekwesịghị ka nnu gafe maọbụ tụọ na ya.”

“Nnụ na-enye anyị bụ ndị ojii nsogbu maka na mbụ mbụ, ndị nnanna anyị ha nọ ya, anyị enwekebeghị nnu nke mere ka obere nnu mara ahụ anya ahụ anyị. Ya mere,anyị rie obere nnu, ọ zuoro ahụ anyị.”

Nnụ karịa n’ahụ anyị o mewe BP ọ rụwa, ụfọdụ enwewa ọbaramgbalielu.”.

2. Ịnụ mmanya na-egbu egbu

Ịṅụ mmanya na-egbu egbu na-emetụ ahụike akịrị.

3. Oke ịnụ ọgwụ ahụ mgbu

Nwantịtị ahụmgbu maọbụ isiọwụwa, ịkponye ọgwụ n’ọnụ na-ajụghị dọkịta ese.

Ị ma na ị jji aka gị eguru onwe gị olulu nsogbu akịrị?

Dịka ndị ọkachasị mara ọgwụ ahụ mgbu na-emerụ akịrị ahụ.

4. Iri nri agba ọhụrụ

Nrị agba ọhụrụ na-akpalite ọrịa na-ebute nsogbu akịrị

Nri ndị Bekee dịka nri mkpọ na nke e ji ntụ ọka were mee nke Bekee kpọrọ ‘junk foods’ na-amasị ndị mmadụ ọkachasị ndị na-eto eto mana ọ bụ nsi nye akịrị.

Dkta Ulasi: “Ụdị nrị ndị be anyị na-eribu dịka ụdị osikapa, ji, akpụ,garị akwụkwọnri nwere faiba nke mere na ọ bụghị ihe nile dị na nri ahụ ga-abanye gị n’ahụ.

“Mana ugbua, anyị na-erizi nri ndịọcha dịka flọọ na shuga nke ihe niile ga-abanye gị n’ahụ.”

O kwuru na ihe ndị a mere na a na-arịazi ọbaramgbalielu,ọrịa shuga,oke ibu(obesity) bụ nke ọ rụtụụ aka na-emebi akịrị.

5. Anaghị eme ngagharị ahụ

Oke ịnọ otu ebe, na emegharịghị ahụ na-ebutekwa nsogbu akịrị dịka ọ na-enye ohere ka ọrịa nwere ike ibute ọrịa akịrị n’ahụ mmadụ.

“Ndị mmadụ anaghị agbakiri ala, megharị ahụ. ụgbọala adịla ebe ọbụla, ndị mmadụ na-aga ha e jiri ụgbọala.”

Dọkịta Ulasị nyere ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị iwu na onye ọbụla ga-aganwu ‘gym’ , i nwere ike imegharị ahụ site na iji ụkwụ na-agharị, na-eje ọrụ maọbụ ejegharị.”

6. Arahụghị ụra

Ụra na-enye ohere ka akụkụ ahụ dị mkpa dịka obi zuo ike

Araghụghị ụra ọfụma, dịka Dkta Ulasi siri kọwa na-emetụta ọbara mgbalielu.

“A na-arahụ ụra, ọbara na-agbatụ ọfụma were nye ike ka ahụ igị, mobi gị naafụ ọbara zuo ike.”

7. Ịnụ sịga

Ịghụ sịga na-emetụta akịrị n’ụzọ jọrọ njọ nke ukwu.

Ụlasị kọwara na,”sịga na-atakụtọ n’akịrị, mebie akịrị.”`Anaghị aṅụ mmiri ọfụma.

8. Ịnụ ọgwụ Igbo

Ndị dọkịta Bekee na-akọwa n’ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpọakwụkwọ na-emerụ akịrị ahụ n’ụzọ puruiche.

Kedụ ihe kpatara nke a?

Ọtụtụ ọgwụ Igbo bụ ka o si sọ onye ka na-anwụ ya.

E nweghị ntụzịaka ole onye ga-aṅụ. Ụfọdụ otu ọnụ na-agwọ nnụ ọrịa.Dkta Ulasị kọwara sị, “Ihe ndị e ji eme ọgwụ Igbo ụfọdụ na-egbu akịrị.”

Labour MP Stella Creasy says the UK government is making a mess of home abortions during the coronavirus crisis

9. Nrị a tụbatara atụbata

Ụfọdụ nrị a tụbatara atụbata bụ ọtọm-egbum

Ndị okwu ahụike doro anya na-akọwakwa na iri nrị e si mba ofesi tụbata na-ebutekwa ọrịa akịrị.

Ụfọdụ nri e si mba Chaịna were kemikal e ji chekwa ya nke na-emebi ihe dị mkpa n’ahụ.

Dika Ulasi si na nkea bụ eziokwu. “Ụfọdụ nrị esi mba ofesi nwere nnu na phosphorus karia etu ahụ chọrọ.”

Leave A Reply

Your email address will not be published.