Take a fresh look at your lifestyle.

Lee usoro ndị ọzọ ị ga-eji zụọ ụmụ gị na-abụghị sọ ịpịa ụtalị

0 629

Ma e kwesịrị ịpịa ụmụaka ụtalị ma e kwesịghị ịpịa ha ụtalị bụ otu n’ime okwu kachasị ebute nrụrịtaụka n’etiti ndị nne na nna nakwa ndị nkuzi n’akụkụ ụwa dị iche iche ugbua.

Mba Scotland bụ mba mbụ machịrị iti ụmụaka ihe maọbụ pịa ha ụtalị, n’ọnwa Nọvemba 2020, na-agbanyeghị na Briten bụ ụzọ malịta atụmatụ ahụ n’ọnwa Epreelụ nke afọ ahụ.

N’Afrịka, ụfọdụ mba dị iche iche a machịela ịpịa ụmụaka ụtalị n’ụlọakwụkwọ dịka na mba Seychelles, Guinea, Ghana, South Africa, Cabo Verde, South Sudan, Congo, Kenya, Tunisia na Togo.

Iti ụmụaka ihe n’ezinaụlọ nakwa n’ụlọakwụkwọ n’Afrịka bụ etu e si zụọ ọtụtụ mana ndị nne na nna ọgbara ọhụrụ na-ekwu ugbua na ha akwadoghị ya bụ atụmatụ.

Otu nwaanyị ọkachamara banyere akparamagwa ụmụaka(child psychologist) bụ Uchenna Enefoh gwara BBC Igbo na ịpịa ụmụaka ụtalị maọbụ iti ha abụghị ụzọ kacha mma n’ịzụ ụmụaka.

Nwaada Enefoh kwuru na e nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ụmụaka ntaramahụhụ ma ha mehie dịka nke ụzọ ọ kpọrọ ‘Positive reinforcement’ nakwa ‘Negative reinforcement’ na Bekee.

Ọ kọwara na inye ụmụaka ihe nrite ngwa ngwa ma ha mee nke ọma na-akpalite mmụọ ha imere ihe ọma gawa n’ihu nke a bụ atụmatụ Positive reinforcement, ebe ịnapụ ụmụaka ihe ndị ha hụrụ n’anya nke ukwu ma ha mee nke ọjọọ maọbụ mehee bụ nke a na-akpọ atụmatụ ‘Negative reineforcement’.

N’okwu ya ọ sị: “Achọpụtara site n’ọrụ m na iti ụmụaka ihe maọbụ ịpịa ha oke ụtalị na-eme ka obi kpọọ ha nkụ nke bụ na ụtalị agaghịzị na-atụ ha egwu”.

Nwaada Enefoh kwusịrị ike na agbanyeghị na ụzọ ndị a nwereike hara ịdị mfe mana na ọ na-adị ire n’ọzụzụ ụmụaka.

O kwukwara na ụmụaka na-eme ihe ha hụrụ ndị nne na nna ha maọbụ ndị na-azụ ha na-eme nke bụ na iji aka ike chọọ ka ụmụaka mee ihe ndị na-azụ ha anaghị eme anaghị adị ire.

Otu nwoke aha bụ Michael* (anyị gbanwere aha ya maka na ọ chọghị ka a mara ezigbo aha ya) gbara ama na ihe nwaada Enefoh kwuru bụ eziokwu n’ihi nna ya tiri ya ihe nke ukwu nke mere obi jiri kpọọ ya nkụ ma ọ bụrụ onye na-anaghị atụ ụtalị maọbụ iti ihe egwu.

O kwuru na n’uche ya, na ọ bụghị iti ihe maọbụ ịpịa ụtalị mere o jiri bụrụ ihe taa ọ bụ ugbua kama na ọ bụ mkpebị ọ meere onwe ya mgbe o tọpụtara dịka okorobịa.

Otu onye nne aha ya bụ Blessing Esione kwuru na iti ụmụaka ihe dị mkpa mana na ọ kwadoghị ime ya oge ọbụla maọbụ mefee ya oke. Ọ tụrụ aka na okpukperechi kraịst kwadoro ya bụ ihe dịka o kwuru na akwụkwọ nsọ ha sị ka ị pịaghị ụmụaka utalị na-emebị ha.

Nwaada Esione kwukwara na iji gbochie ịpịa ụmụaka ụlatị oge niile e nwereike inye ha ntaramahụhụ ndị ọzọ dịka ịsị ha sekpuru ala maọbụ gwaa ha saa ụlọ mposi ruo otu izu.

Otu onye nkuzi n’ụlọakwụkwọ ọta akara bụ Lilian Okafor kwuru na ịnwe mkparịtaụka nakwa nkwukọrịta kacha bụrụ ụzọ dị mma n’ịzụ ụmụaka.

Nwaada Okafor kwuru na ọtụtụ ndị torola anaghị echeta na ụmụaka bụ ndị ka na-amụta ihe ya bụ na ọtụtụ mmeehie dịrị ha dịka mmehie bụ ụzọ e si amụta ihe n’uju.

Ọ kọwara na nkwukọrịta na-emezi ụmụaka ọkacha ma ndị nne na nna bido na-eme ya n’oge mgbe ụmụaka ka dị na nwata.

Nwaada Okafor kwuru na oke iti ihe nakwa ịpịa ụtalị na-etinye ụjọ, esemokwu nakwa nghọtahie n’etiti ndị nne na nna nakwa ụmụ.

Ka o si kwuo: “Ụjọ na-eme ụmụaka amalịte izoro nne na nna ha ihe nke bụ ma ihe ọjọọ ha mere nakwa ihe ọma ha mere”.

O kwukwara na oke iti ihe na-emetụta ahụike ụbụrụisi ụmụaka ihe nwereike ikpata oke egwu nke Bekee kpọrọ “Anxiety”.

Nwaada Okafor kwuru na oke ịpịa ụtalị na-eme ụfọdụ ụmụaka akwụsị ịga ụlọakwụkwọ maọbụ mee ka ịmụta ihe n’ụlọakwụkwọ hara ịdịrị ụmụaka mfe n’ihi egwu na ụjọ na-eso ụtalị.

Otu onye nne bụ Ganiru Okeke kwuru na ịbụ eyi ụmụaka gị bụ ụzọ kacha mma n’igbochi ụmụaka ime oke nnụpụisi. Ọ kọwara na imete ụmụaka gị enyi ga-eme ha emesapụ ahụ. O kwuru na ime nke a ga-eme ụmụaka egosi kpọm kwem onye ha bụ.

Nwaada Okeke kwuru na ọ dịkwa mma ndị nne na nna imata ndị eyi ụmụ ha dịka nke a ga-enyere aka n’imata ebe ụmụaka si amụta ihe ha na-eme.

Otu nne bụkwa onye nwee ụlọakwụkwọ bụ Hilda Adamatie kwuru na ịzụ ụmụaka bụ ihe a na-eme ruo mgbe ha toro, anaghị akwụsị ya n’ụzọ, ọ kọwara mkpa ndịdị dị n’ịzụ ụmụaka ma kwuo na ihe kacha mkpa bụ ndị na-azụ ụmụaka ịbụ enye ụmụaka ahụ.

Nwaada Adamatie kwuru na ịzụ ụmụaka na-abanye otu ọgbọ ntorobịa bụ ihe a na-eme n’ụzọ dị ịche dịka ekwesiri inye ha ohere ka ha kwuo uche ha ma kwanyere ha ugwu ruru ha agbanyeghị na ha na-anata ọzụzụ.

O kwukwara na iti ụmụaka ihe maọbụ pịa ha ụtalị na-eme ka ụmụaka hapụ ịmụta ihe kama ha jiri ụjọ zere ihe a sị ha emena nke bụ na ndị na-azụ ha pụọ ha agaa n’ihu mee ya ma mefee ya oke

Agbanyeghị na ụfọdụ na-akwado atụmatụ ka akwụsị ime ihe ndị a n’ụlọakwụkwọ, okwu a abụbeghị ihe a na-ekwu maka ezinụlọ ndị mmadụ na Naịjirịa.

Otu jịkọrọ ọtụtụ mba n’ụwa bụ United Nations ekwuola na atụmatụ ha bụ ịhụ na amachiri iti ụmụaka ihe maọbụ pịa ha ụtalị n’akụkụ ụwa niile n’afọ 2030.

Ụzọ ndị nkuzi nakwa ndị na-azụ ụmụaka nwereike iji mee ka ụmụaka mee ihe ha chọrọ:

Nwaada Enefoh kọwara na site n’usoro ‘Negative reinforcement’ na ‘Positive reinforcement’ lee ihe ịmatụ ndị na-azụ ụmụaka nwereike ime

  • Inye ụmụaka ihe ha hụrụ n’anya dịka nri, ihe egwuregwu ụmụaka, akwa, akpụkpọụkwụ nakwa ihe ndị.
  • Ịnapụ ụmụaka ihe ha chọrọ dịka ihe egwuregwu ụmụaka, akwa, akpụkpụ ụkwụ nakwa ihe ndị, ihe ejije egwuregwu ụmụaka (cartoon) nakwa ihe ndị ọzọ Enefoh kwuru na ihe kacha mkpa bụ ndị na-azụ.ụmụaka iwepụta oge mara ụmụ ha na-azụ ma hibere usoro ọzụzụ ga-amịta mkpụrụ ha chọrọ n’ihe ụmụaka dị iche n’ụdị n’ụdị.
  • Nwaada Okeke kwuru na ndị nne na nna inwe mwukọrịta kwa mgbe kwa mgbe nke gụnyere ikwupụta na ihụrụha n’anya na-enyere aka imeda mmụọ ha ma mee ka ha hapụ ịnụpụ isi nke ukwu.
  • Nwaada Okeke kwuru na ịmalite na mgbe ụmụaka ka dị nwata na-amakọ ha, na-emetụ ha aka dị ndị ịhụrụ n’anya nakwa igwa ha okwu dịka ndị ikwanyere ugwu na-enyere aka n’ọzụzụ.
  • Adamatie kwuru na ito ụmụaka, kụọrọ ha aka, maọbụ nye ha ihe nrite ma ha mete nke ọma na-eme ka ụmụaka gbaa mbọ imere ihe ọma na-aga n’ihu
  • O kwukwara na ime ka ụmụaka mesapụ ahụ n’akụkụ ndị na-azụ ha bụ ezi ụzọ ịhụ ime mmụọ ha kpọm kwem nke iti ihe na-egbochi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *