Take a fresh look at your lifestyle.

Iwu ọhụrụ: ‘Onye kwụọ ndị ntọrọ ụgwo mgbapụta, ọ gaa nga ruo afọ 15’ – Ụlọomeiwu Naịjirịa

0 885

Ụlọomeiwu Naijiria ewepụtala iwu ọhụrụ kwuru na onye ọbụla kwụrụ ndị omekome ụgwọ mgbapụta iji tọhapụ onye a tọọrọ ga-aga nga ruo afọ iri na ise.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ atụmatụ a ma na-ekwu na nke a ezighi ezi ebe ọ na-emegide ndị na-achọsi ike ịgbapụta ndị ikwu ha.

Iwu a nke a na-eche ka Onyeisiala Muhammdu Buhari binye aka nakwa ka ụlọomeiwu nta tinye ọhụ, ga-ahụ na onye ọbụla e jidere na-atọ mmadụ ga-aga nga mkpụrụ ọka maọbụ nata ikpe ọnwụ.

Kemgbe ihe karịrị afọ iri, Naịjirịa na-agbasi mbọ ike ime ka ndị otu ji egbe na-atọọrọ ndị mmadụ aghara aghara ma na-anapụ ndị ikwu ha ego mgbapụta kwụsị ọrụ ha mana nke adịbeghị ire

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *